Osimiri ọgwụrụgwụ itunanya
Mimi Werna
Edwin Irabor

Umunne ato, Udoo, Erdoo na Eryum gere egwu mmiri ozuzo na-aku. Ha choro igba egwu n'ime ya. Ha chọrọ ịmetu ọgwụrụgwụ pụtara n'elu-igwe aka. Nne ha si, "Mba."

Ha bere akwa n'ele anya ma ọ ga-agbanwe uche ya. Ọ kweghi. Eryum nwara I si n'ụlọ mipu ka ọ jee leta ọgwụrụgwụ.

1

Nne ya jidere ya tupu ọ puo. O tie mkpu ka Eryum na umunne ya nuru ihe ọ n'ekwu.

Ọ sị, "Oyi nwere ike iba gi ahụ." Nne chịrị ọchị si, "Ọ bụrụ na oyi mawa gi, I ga-añu mmiri ọkụ ose di n'ime ya, nke anaghi amasi gi."

2

N'olileanya na ha ga-ariọ ya ka ọ kọọ akụkọ, ọ si, "Ọgwụrụgwụ bu osimiri ịtunanya nwere ike ọgwugwọ ọria. Kama ọ di elu n'elu-igwe nke ukwuu na-inweghi ike irutu ya. Oyi mawa gi, ọgwụrụgwụ enweghi ike inyere gi aka.

Umu ya wee chee maka nke a.

3

Erdoo wee si, "Nne, biko kọọrọ anyi akụkọ ọgwụrụgwụ." Udoo wee si, "Ee, biko nne, achokwurum inụ ya. "Achọkwuru m," Eryum riọrọ, wee welie mkpisi aka atọ.

N'egwuregwu, nne kwuru "Ka m lee, mmmm. Ọ di nma ụmụọma, gbakotanu. Nne, onye akụkọ a biala!"

4

Erdoo gbapuru I weta naha, osisi eji esi nri ejiri mara ha. Ọ nye ya nne ha. Eryum wetara ichafu isi ka nne ha sụrụ. Nke a mere nne ha o yie onye ozo.

Ha niile noduru ala juu ige nti n'akụkọ ha nuworo ọtụtụ mgbe. Udoo furu opi, igwa nne ha ka o malite. Akụkọ wee malite.

5

"Otu mgbe, ọgwụrụgwụ bu osimiri itunanya. O zoro n'ime oke ohia Mbadede. N'ihi ike igwo oria ọ nwere, e chere ya nche.

Ọ bụrụ na I ria oria, I ñuo mmiri ya. Ọ na-amasi ọgwụrụgwụ ahu inye mmiri ya. Kama ọ choghi ndi omume ọjọọ.

6

"N'ihi itunanya nke osimiri ahu, ihe nracha utọ di n'akụkụ mmiri ahu. Onye obula biara I ñurutu mmiri ya ratukwara ihe nracha ụtọ, tumadi umuaka.

Ihe nracha ụtọ mmiri ahu na-acha mmee mmee, oroma, edo-edo, akwụkwọ ndụ, anụnụ, ododo na ihe na-achatu ka ododo."

7

"Otu ụbọchi, otu agadi nwanyi anụ ntị ana-akpo Mbom si ebe tere aka bia. O zutere onye nche. Ọ maghi nwanyi a ma ọ nwere mmetuta di iche n'obi ya. Kama ọ geghi mmetuta ahụ ntị.

O gosiri nwanyi uzọ gara n'ime ohia ma gwa ya ka ọ kwanyere osimiri ahu ùgwù. Mbom kwetara ma gawa na mmiri ahụ."

8

"Ọ ñuru mmiri, ahu wee di ya mma. Ọ leghariri anya imata ma ọ nwere onye n'ele ya anya.

Mbom weere nkume, tunye n'ime mmiri. Ọ lere ka mmiri si bilie, wee gbasaa. Obi tọrọ ya ụtọ, ọ were osisi tunye n'ime mmiri. Ihe ahu mekwara ozo."

9

"Mbom mabara n'ime mmiri! Ọ nwere olileanya inweta ndu ebighi ebi. Ozigbo ọ mabara, osimiri bilie. Ọ gbaliri elu rue elu-igwe, ma ọ gaghi aloghachite Mbadede. Mana oge ufodu ọgwụrụgwụ n'abia oge mmiri zochara, ka ọ dikwa ka osimiri ozo."

Nne ha wee si, "Ebe a ka akụkọ m biri."

10

Nne jụọ sị, "Ụmụọma m, gwam ihe kpatara akụkọ a ji masi unu nke ukwuu? Unu na-asikari m kọọ ya."

Udoo chia si, "Ọ masiri m n'ihi na ọ n'echetara m itinye uche na mmetuta obi m."

Erdoo si, "Ọ n'enyere m aka icheta otu ọgwụrụgwụ si acha."

11

Eryum nwara ike ya si, "Ọ masiri m n'ihi na ọ n'echetara m maka ihe nracha di ụtọ. I ga-enye m ụfọdụ ugbua, bikoooooo?"

Nne wee si, "Mmmm. Oyi di ugbua, k'anyi rachaa ya echi. I kwetara?" O tinye kwa, "Oge ọzọ, aga m akọ maka njedebe ọgwụrụgwụ."

12
You are free to download, copy, translate or adapt this story and use the illustrations as long as you attribute in the following way:
Osimiri ọgwụrụgwụ itunanya
Author - Mimi Werna
Translation - Amarachukwu Onwuzurumba
Illustration - Edwin Irabor
Language - Igbo
Level - Longer paragraphs