Chiokike na-enye ụkwụ!
Mutugi Kamundi
Wiehan de Jager

Na mgbe gara aga, ụmụ anụmanụ enweghị ụkwụ.
Ha nile na-akpụ akpụ n'ala.

1

Nanị ụmụ mmadụ nwere ụkwụ Chiokike nyere ha.

2

Otu ụbọchị, Chiokike ekpebie inye ụmụ anụmanụ nile ụkwụ. Ọ chọrọ ka ụmụ anụmanụ nile na-aga ije. O wee gwa ha maka ya.

3

Obi tọrọ ụmụ anụmanụ ụtọ. Ọmasịrị ha inwe ụkwụ ha ga-eji gaa ije ma gbakwaa ọsọ. Ha wee bụọ abụ gbakwaa egwu.

4

Ụmụ anụmanụ sịrị na ọ rara ahụ ikpụakpụ n'ala. Ha na-enwe ihe mgbu n'ahụ ha.

5

Mgbe ụbọchị ahu ruru, ọtụtụ ụmụ anụmanụ kpụụru-akpụ garuo n'ụlọ Chiokike. Jirafụ, ọdụm, enyi, ewii, aguiyi na ụmụ nnụnụ wee nọrọ n'ahịrị.

6

Anụmanụ ọbụla natara ụkwụ anọ. Nnụnụ ọbụla natara ụkwụ abụọ.

7

Ụmụ anụmanụ gbanwere mgbe ha nwetara ụkwụ. Ụfọdụ tegharịrị egwu ọňụ. Ndị ọzọ dara n'ala.

8

Ha wee gaa gosi ndị mmadụ. Ụmụ anụmanụ wee sị, "Anyi apụkwaghị ịkpụ-akpụ ọzọ."

9

Anụmanụ nk'ikpeazụ n'ahịri bụ Arịrị. Chiokike wee jụọ ya sị, "Onwere onye na-esote gị n'azụ?" Arịrị zara sị ya,"Mba, abụ m onye ikpeazụ."

10

Chiokike wee chee echiche, "Ọ bụ ya bụ onye ikpeazụ. Gịnị ka m ga-eji ụkwụ ndịa fodụrụ eme?"
Chiokike wee nye Arịrị ụkwụ nile fọdụrụnụ.

11

Obi wee tọọ Arịrị ụtọ nke ukwuu. O wee sị, "Aga m na-aga ije ọsịsọ karịa ndị ọzọ."

12

Mgbe Arịrị lara, Agwọ wee bịa n'ụlọ Chiokike. O wee sị Chiokike, "Biko, nyetụ m ụkwụ olemole."

13

Chiokike wee sị ya, "Enyepuchaala m ụkwụ nịle. Oleekwanu ebe ị nọ?"
Agwọ wee zaa sị, "Ehifere m ụra oke."

14

Chiokike wee sị Agwọ, "Ndo. Ọdịghịkwa ụkwụ fodụrunụ." Agwọ wee kpụrụkwa akpụrụ laa n'ụlọ ya n'enweghị ụkwụ.

15

Site n'ụbọchị ahụ, Agwọ anaghị ehikwa oke ụra. Ọ na-eche ka ọ bụrụ onye mbụ n'ahịrị maka ịnata ụkwụ.

16
You are free to download, copy, translate or adapt this story and use the illustrations as long as you attribute in the following way:
Chiokike na-enye ụkwụ!
Author - Mutugi Kamundi
Translation - Nwanne Felix-Emeribe
Illustration - Wiehan de Jager
Language - Igbo
Level - First paragraphs