Ndị ndú nta: Idobe gburugburu anyị ọcha
Ruth Asuquo
Gideon Eyo

Lumbazi gaara ibu ebe dị mma, ma ihe nile banyere gburugburu ebe obibi ya dị njọ.

E nwere karama ndị gbajiri agbaji n'ebe nile. Iberibe akwụkwọ juru n'okporo ámá, ikuku ya na-esikwa ísì ọjọọ.

1

Ụmụaka merụrụ ahụ site na karama ndị gbajiri agbaji.

2

Mgbe ifufe na-efe, iberibe akwụkwọ na-efegharị ma na-ada n'osisi nakwa n'elu ụlọ.

Nke a mere na ọtụtụ ndị mmadụ anaghị aga obodo Lumbazi.

3

Otu ụbọchị, Chike dị afọ itoolu na ndị enyi ya turu alo.

"Ka anyị mee ka gburugburu ebe obibi anyị dị ọcha. Anyị pụrụ ịzacha, chịkọta karama ndị gbajiri agbaji ma mepụta ihe mkpofu n'ụlọ anyị na n'okporo ama anyị".

4

"Nke a ga-enyere anyị aka ịna-adị ọcha. Ọ ga-adọta ndị obodo ndị ọzọ ịbịa leta anyị", ka Chike gara n'ihu kwuo.

5

Ka ọ ka n'ekwu okwu, Obi kwuru, sị, "M ga elezi anya nke ọma ma chịkọta karama ndị ahụ gbajiri agbaji. M ga-edebe ha n'ebe ha na-agaghị emerụ anyị ahụ́".

6

Felix kwuru, sị, "M ga-eweta otu n'ime bọket ochie ndị dị n'ụlọ m ka anyị wee jiri ya mere ebe mkpofu ahịhịa".

7

Ha rụkọro ọrụ ọnụ ụbọchị niile.

Site n'ụbọchị ahụ, Lumbazi wee buru obodo n'adị ocha na ebe dị mma mmadụ ọbụla nwere ike ibi.

8
You are free to download, copy, translate or adapt this story and use the illustrations as long as you attribute in the following way:
Ndị ndú nta: Idobe gburugburu anyị ọcha
Author - Ruth Asuquo, Gideon Eyo
Translation - Merit Ibekeme
Illustration - Gideon Eyo, Kelvin Obi, Victoria Orok, Fedora Obi
Language - English
Level - First paragraphs