

Tom buuru efere obosara e tinyere unere chara acha.
Tom na-aga ahịa ire unere.
Ndị mmadụ nọ n'ime ahịa ahụ na-azụ mkpụrụ osisi.
Ma ọ dịghị onye na-azụ unere Tom n'ere.
Ha na-ahọrọ ịzụta mkpụrụ osisi n'aka ụmụ nwaanyị.
"N'obodo anyị, ọ bụ naanị umu nwaanyị na-ere mkpụrụ osisi", ka ndị mmadụ na-ekwu.
"Kedu ụdị nwoke onye a bụ?" ka ndị mmadụ na-ajụ.
Ma, Tom akwụsịghi ire unere ya.
Ọ na-akpọku, sị, "Zụrụnụ m unere! Zụrụ nu unere m di uto ma chakwa acha!"
Otu nwaanyị welitere ụyọkọ unere n'ebe a kpọsara ha.
Ọ leziri unere ndị ahụ anya nke ọma.
Nwaanyị ahụ zụtara unere ndi ahụ.
Ọtụtụ ndị mmadu bịakwara n'ebe Ọ n'ere ahịa.
Ha zụtakwara unere Tom n'ere ma rie ha.
N'oge na-adịghị anya, efere obosara ahụ tọgbọrọ chakoo, enweghizi unere fọrọ.
Tom gụọ ego o nwetara n'unere Ọ rere.
Tom azụta ncha, shuga, na achịcha.
Ọ tinye ihe ndị ahụ n'ime efere obosara ya.
Tom tinyere efere obosara ahụ n'isi ya ma laa ụlọ.

