Nwoke Nwere Nnukwu Nsogbu
Ursula Nafula
Abraham Muzee

Mandu na Nnukwu nne na nna ya, nwanne nna ya nwoke na nwanne nna ya nwaanyi bi. O nwere ọkụkọ, ewu, atụrụ na ézì.

Nne ọkụkọ ahụ nọrọ n'obere ụlọ. E kegidere ewu, atụrụ na ezì n'otu akụkụ nke mgbidi ụlọ ahụ. Nnukwu nne na nna ya ahụ ka dịkwa ndụ. Nwanne nna ya nwoke na nwanne nna ya nke nwaanyi na-enye aka n'ọrụ ahụ.

1

Nke a gbanwere ka afọ ole na ole gasịrị. Nnukwu nne na nna Mandu emeela agadi, ha apụghịzi ịnụ ihe ma ọ bụ ịhụ ụzọ nke ọma.

Nwanne nna ya nke nwaanyi malitere ịrịa ọrịa, o nweghịkwa ike inye aka hichaa ụlọ.
Nwanne nna ya nke nwoke na-ehi ụra mgbe nile, ọ dịghịkwa enye aka n'inye ụmụ anụmanụ nri.

2

Anụmanụ ndị ahụ mere mkpọtụ nke ukwuu n'ihi na agụụ na-agụ ha.

Ụlọ ahụ ruru unyi nke ukwuu n'ihi na nwanne nna ya nke nwaanyi ehichaghi ya.

Ike na-agwụ Mandu mgbe niile. Ọ na-apụ ụbọchị niile ịga chọọ nri ha niile ga-eri.

.

3

Mandu enweghịzi ike ịnagide ọnọdụ ahụ. Ọ gwara nnukwu nne na nna ya ndi mere agadi ka ha nyere ya aka. Obi adịghị ya mma n'ihi na nnukwu nne na nna ya anụghị ihe o kwuru.
Nwanne nna ya nke nwaanyi, ahụ́ na-adịghị kwuru, sị, "Nanị ihe m chọrọ bụ inwe ike ihi ụra n'abalị ma teta n"ụtụtụ".

4

Nwanne nna ya nke nwoke dị umengwụ sịrị ya, "Ree umu anụmanụ ndị a ma zụtara nnukwu nne na nna gị nri. Ha ga-ehi ụra ma ghara inye gị nsogbu".


Mandu were iwe. O kwuru, sị, "Nwanne nnam nwoke, ị mara na enweghị m ike ire ụmụ anụmanụ ndia. Ọ bụ ha bụ nanị akụ̀ m nwere".

5

N'otu abalị, Mandu ehighị ụra. O chetara otu nwoke nwere amamihe nke e kweere na o nwere ọzịza nye nsogbu niile.
Mandu kpọọrọ ụmụ anụmanụ ya gaa leta nwoke ahụ nwere amamihe. O tinyere eriri n'elu ewu, atụrụ na ezì ma maburu ọkụkọ.

6

Mandu bịarutere n'ụlọ nwoke ahụ maara ihe, ike gwụrụ ya, agụụ ana-agụkwa ya.

Mgbe Ọ kọwachaara nwoke ahụ maara ihe nsogbu ya, nwoke ahụ maara ihe sịrị ya, "M ga-enyere gị aka, ma ị ga-emerịrị ihe m gwara gị mee".

Mandu zaghachiri, sị, "Aga m eme ihe ọ bụla iji mezie nsogbu m".

7

Nwoke ahụ maara ihe kwuru, sị, "Hapụ umu anụmanụ ndị a n'ebe a ma laghachi n'ụlọ unu".

Mandu sịrị, "Ma mụ na ụmụ anụmanụ m ebiela ogologo oge. Ọ bụ ha bụ nanị akụ̀ m nwere".

8

Nwoke ahụ maara ihe kwuru, sị, "Agwara m gị na m ga-enyere gị aka ma ị ga emerị ihe m kwuru".

Mandu chọrọ ihe ọzịza nyere nsogbu ya. Ọ hapụrụ umu anụmanụ ya ma laghachi n'ụlọ ha.

9

Ụlọ ha dara jụụ ma tọgbọ chakoo. Ọ dịghị onye ọ bụla hụrụ ụmụ anụmanụ ndị ahụ. Nnukwu nne na nnukwu nna Mandu kpesara na ha enweghị mmiri ara ewu.
Nwanne nna ya nke nwoke ahụ sịrị, "Anyị dara ogbenye nke ukwuu, onye ọ bụla na-achị anyị ọchị".

10

Mandu enweghịzi ike ịnagide mkpesa ndị ahụ. Ya onwe ya nwekwara mmasị ịhụ umu anụmanụ ya.

Ọ gakwuuru nwoke ahụ maara ihe ka o nye ya ndụmọdụ. "Ndụ dị nnọọ iche ma ọ bụrụ na ụmụ anụmanụ m anọghị n'ụlọ. Agụụ ha na-agụ ndị ikwu m nke ukwuu".

11

Nwoke ahụ maara ihe kwuru, sị, "M ga-enyere gị aka ma ị ga-emerịrị ihe m gwara gị. Laghachi n'ụlọ gị, kpọrọ nnukwu nne na nna gị kpọpụ n'ụlọ".

Mandu juru, "Kedu otú m ga-esi eme ya? Ha bụ nnukwu nne na nna m, ilekota ha bụ ọrụ diiri m".

12

N'ikpeazụ, Mandu lara n'ụlọ ma mee ihe a gwara ya. Obi ya anọghị n'udo.

Nnukwu nne na nna ya enweghị ebe ha ga-aga. Ha na-awagharị, na-agbalị ka ha ghara ịdaba n'ihe na-emeru ahụ. Anwụ na-acha n'ehihie chara ha, oyi ana-atụkwa ha n'abalị.

13

Nwanne nna ya nke nwaanyi na-arịa ọrịa tiri mkpu, sị, "Atụpụla m n'ụlọ a!"

Nwanne nna ya nke nwoke dị umengwụ tiri mkpu, sị, "Atụpụkwala mu onwe m n'ụlọ a!"

14

Mandu enweghịzi ike idi ya. Ọ lọghachikwutere nwoke ahụ maara ihe na mgbagwoju anya na iwe.
O bere ákwá ma kwuo, sị, "Nke a karịrị otu onye akarị. Gwa m ụzọ ọzọ ka mma".

15

Nwoke ahụ maara ihe gwara ya, sị, "Ugbua, kpọrọ ụmụ anụmanụ gị laa n'ụlọ ma kpọlata nnukwu nne na nna gị n'ụlọ".

Mandu mere ihe a gwara ya. Nwanne nna ya nke nwaanyi kwuru, sị, "M ga-ehicha ụlọ".

Nwanne nna ya nke nwoke kwụsịrị ịdị umengwụ ma malite inyere Mandu aka n'ọrụ. Ha nile nwere ọṅụ ọzọ

16
You are free to download, copy, translate or adapt this story and use the illustrations as long as you attribute in the following way:
Nwoke Nwere Nnukwu Nsogbu
Author - Ursula Nafula
Translation - Merit Ibekeme
Illustration - Abraham Muzee
Language - English
Level - Longer paragraphs