Mbe, onye bụ dike
Ntombifuthi Ncwayiba
Khanyisa Masemola

Ogologo oge gara aga, ụmụ anụmanụ ndị bi n'ọhịa enweghịzi mmiri.

Ha chọgharịrị ebe niile ma ha ahụghị mmiri.

1

Ha zukọrọ iji chọta ụzọ esi dozie nsogbu ha. Ụmụ anụmanụ nile bịara nzukọ ahụ, ma e wezụga nkịta ọhịa.

Nkịta ọhịa sịrị, "Kedụ ka m ga-esi soro mbe na-esi ísì ọjọọ nwee nzukọ?"

2

Na nzukọ ahụ, ụmụ anụmanụ ahụ kwetara igwu olulu mmiri.

Ele kwuru, sị, "Olulu mmiri anyị ga-emi emi ma saa mbara. Mgbe o jupụtara, anyị agaghị enwekwa nsogbu mmiri ọzọ."

3

Ha na-abụ abụ ma na-agba egwu ka ha na-egwu olulu mmiri ahụ n'otu n'otu.

N'ikpeazụ, mmiri si n'ala bata n'olulu mmiri ahụ.
Obi dị ha ezigbo ụtọ. Ha ahụtụbeghị ụdị mmiri dị ụtọ ma dị ọcha otu a mbụ.

4

Otu ụbọchị, ụmụ anụmanụ ahụ chọpụtara na e nwere onye na-egwu mmiri n'ime mmiri ahụ ma na-emetọ ya.

Ha malitere iche olulu mmiri ahụ nche n'otu n'otu.

5

Mgbe ọ bụ oge oke oyibo iche olulu mmiri ahụ nche, ọ nọ na-eche olulu mmiri ahụ nche. Nkịta ọhịa ji ụdọ ya oji awụli elu bịa.

"Gịnị ka ị na-eme ebe a?" ka nkịta ọhịa jụrụ.

"Ichebe mmiri anyị nche", ka oke oyibo zara.

6

Nkịta ọhịa gwara oke oyibo ka ya na ya gwurie egwu.

Egwuregwu ahụ na-agụnye iji ụdo kee onye na-egwu egwu ahụ, mechie anya ya ma gụọ onụọgụgụ rụọ otu puku.
Oke oyibo kwetara igwu egwu ahụ.

7

Nkịta ọhịa kere oke oyibo, oke oyibo ahụ mechiri anya ya ma bido ịgụ ọnụọgụgụ.
Nkịta ọhịa ṅụrụ mmiri sị n'olulu mmiri ahụ ma gwuo mmiri ahụ.

Mgbe nke ahụ gasịrị, nkịta ọhịa kuuru mmiri wee pụọ. Oke oyibo ka na-agụkwa ọnụọgụgụ.

8

oke oyibo gụchara ma meghee anya ya.

Ọ hụrụghị nkịta ọhịa.

Oke oyibo tiri mkpu ka ụmụ anụmanụ ndị ọzọ bịa tọpụ ya n'ụdọ ahụ.

9

Ụmụ anụmanụ ahụ gara n'ihu na-eche olulu mmiri ahụ nche n'otu n'otu, ma ha nile ejideghị nkịta ọhịa.

Mbe kwuru sịrị, "Ka m na-eche olulu mmiri a nche" Ọ banyere n'ime olulu mmiri ahụ iji chere nkịta ọhịa.

10

Mgbe nkịta ọhịa rutere, o chere, " Ọ dịghị onye nọ ebe a!" Ọ malitere ịṅụ mmiri.

Ọ nwere mmetụta na-enwere ihe na-ata ire ya. Mgbe ahụ, ihe ahụ dọkpụụrụ ya n'okpuru mmiri!

Ụmụ anụmanụ ndị ọzọ gbaara ọsọ bịa mgbe ha nụrụ ka nkịta ọhịa na-ebe ákwá ma na-agbasa onwe ya mmiri.

11

Ụmụ anụmanụ ahụ kegidere nkịta ọhịa.

Mbe gwara nkịta ọhịa, "I mejọọla anyị niile. A ga-ata gị ahụhụ". Ụmụ anụmanụ ahụ toro mbe dị ka dike ha.

Site n'ụbọchị ahụ gaa n'ihu, ha na-aṅụ mmiri dị ọcha n'enweghị nsogbu ọ bụla.

12
You are free to download, copy, translate or adapt this story and use the illustrations as long as you attribute in the following way:
Mbe, onye bụ dike
Author - Ntombifuthi Ncwayiba
Translation - Merit Ibekeme
Illustration - Khanyisa Masemola
Language - English
Level - First paragraphs