

Thakgalo pụtara obi ụtọ.
Thakgalo bụ onye na-eji oche nkwagharị.
Ndị ezinụlọ ya na ndị enyi ya hụrụ ya n'anya nke ukwuu.
Thakgalo nwere mmasị n'ebe ịkpọ egwu no.
Ndị enyi ya na-enwe mmasị ịgba egwú na ịkpọrọ ya egwu.
Ndị enyi ya rụnyere ígwè okwu na-eme ka a na-anụ ụda egwu n'oche nkwagharị Thakgalo.
Mgbe ọ bụla o metụrụ bọtịnụ dị n'otu akụkụ oche nkwagharị ahụ aka, ọ na-akpọ egwu.
Thakgalo na-agbatị onwe ya ma na-agba egwu na-akpọ n'oche nkwagharị ahụ.
O mụtara ịgba egwu n'onwe ya, ma mechaa soro ndị enyi ya na-agba egwu.
Otu ụbọchị, ndị enyi ya hụrụ ọkwa a mara n'akwụkwọ akụkọ banyere asọmpi ịgba egwu.
Ha jụrụ nne Thakgalo ma ha e nwere ike idebanye aha Thakgalo iji sonye n'asọmpi ahụ.
Nne Thakgalo kwetara.
Ndị enyi Thakgalo gbaziri ekwentị nne Thakgalo iji mee vidio maka asọmpi ịgba egwu ahụ.
Ha mere vidio ebe Thakgalo na-agba egwu kachasị amasị ya, emesia, ha zigara vidio ahụ na asọmpi ahụ.
A họọrọ Thakgalo maka asọmpi ahụ!
Ka ụbọchị asọmpi ahụ bịara.
Thakgalo yi uwe ọhụrụ mara mma
Mgbe egwu bidoro, ọ na-emegharị ahụ ya n'udo na n'ọṅụ
Ndị nọ n'ebe ahụ nọ na-akpọ aha ya, sị, "Thakgalo! Thakgalo!
N'ezie ọ bụ ya bụ onye kacha gbaa egwu n'ụbọchị ahụ.
Thakgalo meriri asọmpi ahụ ma nweta ọtụtụ onyinye..

