

N'obodo Masoyi, e nwere otu nwata nwaanyị maara ihe nke ukwuu aha ya bụ Nomusa. Ya na nnukwu nne ya bi, nnukwu nne ya bụ onye na-akọ ọka.
Ọtụtụ n'ime ndị bi n'obodo ahụ amaghị ka e si agụ ihe na ka e si ede ihe. Ọrụ ugbo bụ ihe ha ji akpata ihe ha ji ebi ndụ.
Nomusa nwere mmasị ịga akwụkwọ, nnukwu nne ya na-enwekwa obi ụtọ n'ebe ọ nọ.
Mgbe ọ bụla ọ lọtara akwụkwọ, nnukwu nne ya na-enye ya ọrụ ndị ọ ga na-arụ n'ubi ha.
Ọ na-achụsị enwe na nnụnụ ndị chọrọ iri ihe ha kọrọ n'ubi ha.
O siiri Nomusa ike ịna-achụ enwe na nnụnụ n'ehihie ọbụla. Ọtụtụ mgbe, ọ naghị enwe ohere ịrụcha ihe omume ụlọ akwụkwọ e nyere ya ka ọ rụọ n'ụlọ.
Ọtụtụ ụmụaka nọ n'obodo ahụ na-agha akwụkwọ n'ihi na ha na-arụ ọrụ n'ubi.
Ka oge na-aga, ike gwụrụ Nomusa ịchụ nnụnụ na enwe.
"Enwere m ezi echiche", ka o chere.
Nomusa gbadoro anya nke ọma ma keekoo ogologo osisi abụọ ọnụ. O yiiwere osisi ahụ akwa ọrụ ya.
O kwụbara osisi ahụ ọtọ ma tinye okpu ọrụ ya n'elu ha.
Ọ bụ ihe na-atụ egwu!
Nomusa tinyere ihe na-atụ egwu n'etiti ubi ọka.
"Nke a ga-anọchite anya m ebe m ga na-eme ihe omume ụlọ akwụkwọ m. Nnukwu nne m ga-eche na m nọ n'ubi" Nomusa chịịri onwe ya ọchị.
Kwa ụbọchị, ọ na-ebuga akpa akwụkwọ ya n'ubi.
O na-eyi akwa ụlọ akwụkwọ ya ma tinye akwa ọrụ ya n'elu ihe ahụ na-atụ egwu.
Omesia, ọ gaa mee ihe omume ụlọ akwụkwọ ya n'okpuru osisi.
Ka ụbọchị na-agafe, Nomusa chere si, "Nnukwu nne m agaghị achọpụta maka atụmatụ a m chepụtara"
Nomusa nwere obi ụtọ na ịtụnanya n'otu oge ahụ.
Enwe na nnụnụ ndi ahụ abanyeghị n'ubi ọka ahụ.
N'otu ehihie, Nnukwu nne Nomusa gara n'ubi iji nweta nri ọhụrụ.
Ubi ahụ dị nnọọ jụụ. Ọ dịghị enwe ma ọ bụ nnụnụ ọ bụla nọ ebe ahụ.
Nnukwu nne Nomusa chere n'obi ya sị, "Nomusa na-arụ ezigbo ọrụ."
Nnukwu nne Nomusa tiri mkpu, sị, " Nomusa! Nomusa! Ebee ka ị nọ?
Enweghi onye zara ya.
Mgbe ahụ ọ hụrụ ihe na-atụ egwu n'etiti ubi ahụ, nke yi akwa Nomusa!
Mgbe nnukwu nne Nomusa chọpụtara ihe Nomusa mere, obi dị ya ụtọ maka ụdị nwa nwa ọ nwere.
O chere si, "Nke a bụ nnọọ ihe amamihe dị na ya. Nomusa ekwesighi ịga n'ubi iji chụpụ enwe na nnụnụ."
Onye ọ bụla nọ n'ime obodo ahụ nwere mmasị n'echiche ọma Nomusa chepụtara. Ha nile malitere itinye ihe ahụ na-atụ egwu n'ubi ha.
Ihe ahụ na-atụ egwu na-eme ka enwe na ụmụ nnụnụ ghara ịbata n'ubi.
Ụmụaka pụkwara ịga akwụkwọ kama ilekọta ihe akọrọ n'ubi.


