Mama Sophie, onye obi ike
Thandiwe Dlodlo
Simon Mokoena

N'otu ụbọchị okpomọkụ na-ekpo Khosi nọ na-agagharị agagharị, na-eche ihe ọ ga-eme.

Nne ya gara ọrụ ubi, hapụ Khosi.

"Gịnị ka m ga-eji onwe m mee?" ka Khosi kwusara onwe ya.

1

Otu echiche gbatara Khosi n'uche.

"Aga m egwu mmiri n'osimiri, mana onye ga-eso m?" ka Khosi chere.

N'oge ahụ, Mama Sophie gafere, na-aga n'osimiri. O bu nnukwu nkata akwa juru n'ime ya.

2

"M ga-eso Mama Sophie gaa n'osimiri!" ka Khosi gwara onwe ya.

"Biko m nwere ike iso gị gaa n'osimiri?" ka Khosi jụrụ. Mama Sophie chiri ọchị ma kwee n'isi.

Ka ha na-aga, Nozipho sonyeere ha. Nozipho enweghị mmasị igwu mmiri ma ikiri ka ndị ọzọ na-egwu mmiri na-atọ ya ụtọ.

3

N'osimiri ahụ Khosi gwara onwe ya si, "Taa, m ga-akwusi igwu mmiri n'ime mmiri na-emighị emi, dị ka nwa ọhụrụ! Aga m egosi mmadụ niile na m nwekwara ike igwu mmiri n'ime mmiri miri emi."

Ọ dabara n'ime osimiri. Pịa!

Nozipho nọ n'ebe dị anya na-ekiri ihe na-emenụ.

4

Ka Nozipho nọ na-ele ihe na-emenụ, ụmụaka ahụ nile nọ na-ekpori ndụ n'osimiri ahụ.

Ha na-egwu mmiri n'olu dara ụda.

Ha n'etiri onwe ha mkpu ọṅụ n'ime mmiri ahụ.

5

Nozipho lere anya ọzọ nke ọma, e nwere ihe dị iche. Khosi nọ na-egwu mmiri n'ebe dị anya site n'ebe ụmụaka ndị ọzọ nọ. Nozipho bịaruru nso ma legharịa anya ọzọ.

Ụjọ tụrụ ya n'ihi ihe ọ hụrụ , ọ gbagara n'ebe ndị umu nwaanyị ahụ na-asa akwa nọ n'akụkụ osimiri ahụ.

"Nyenuu Aka! mmiri na-eri Khosi ," ka Nozipho tiri n'mkpu.

6

N'otu ntabi anya, Mama Sophie wụbara n'ime mmiri ahụ. Ọ nọ na-egwu mmiri n'osimiri ahụ.

Ọ banyere n'ime mmiri, pụtakwa n'elu mmiri, ma laghachi n'ime mmiri ọzọ, na-achọ Khosi.

O jidere Khosi n'aka ma na-egwu mmiri n'ebe na-emighị emi. Mgbe ahụ, Mama Sophia buuru Khosi si n'osimiri ahụ pụta.

7

Mama Sophie ji ọsọ gafee ìgwè ụmụaka na ndị nne nwaanyị na-ebe ákwá ma na-eti mkpu.

Nozipho gbaara ọsọ soro ya n'azụ ka ọ na-agbaga n'ụlọọgwụ obodo ahụ, ma buru Khosi n'azụ ya.

8

N'ụlọ ọgwụ ahụ, otu nọọsụ aha ya bụ Noxolo gbaara ọsọ bịa nyere mama Sophie aka.

Nọọsụ Noxolo kpọbatara Khosi n'otu ọnụ ụlọ ngwa ngwa, ndị nọọsụ ndị ọzọ jikwara ọsọ bịa nyere ya aka.

Ahụ dị ya mma! Anyị nwere isiọma na ọ nọghị n'okpuru mmiri ruo otu sekọnd ọzọ!" ka Nọọsụ Noxolo kwuru.

9

Mama Sophie bia kudata, obi dajuru ya.
Onye ọ bụla nọ n'ụlọ ọgwụ ahụ kelere ya maka obi ike ya na otu o si mara igwu mmiri nke ọma.
"A na m enye chukwu ekele na m nwere ike ịzọpụta ndụ," ka Mama Sophie ji obi umeala kwuo.

10

Akụkọ ahụ ruru onyeisi obodo ahụ ntị. O zigara onye ozi ka ọ kpọọ Mama Sophie.

Mama Sophie kọwaara onyeisi ha otu o si bụrụ onye na-egwu mmiri nke ọma.

"Mgbe m bụ nwata, enyi m bi n'ofe nke ọzọ nke osimiri ahụ. Mmiri so na ihe anyị ji adi ndụ kwa ụbọchị. Anyị chere na ọ dị mkpa ịmụta ịgwụ mmiri!" ka o kwuru.

11

Onyeisi ahụ kpọrọ nzukọ ma kwuo na ya ga-enye Mama Sophie ụgwọ ọrụ maka omume ngosipụta obi dike ya.

Ụmụ nwaanyị nọ na-eti mkpu, umu nwoke nọ na-afụ opi, ụmụaka nọkwa na-eti mkpu ọṅụ. Site n'ụbọchị ahụ gaa n'ihu, ọ na-amasị ụmụaka iso Mama Sophie, na-abụ abụ, "Ọ dịghị ihe pụrụ imetụ m aka, na Mama Sophie, onye nwere obi ike, no n'akụkụ m!"

12
You are free to download, copy, translate or adapt this story and use the illustrations as long as you attribute in the following way:
Mama Sophie, onye obi ike
Author - Thandiwe Dlodlo
Translation - Merit Ibekeme
Illustration - Simon Mokoena
Language - English
Level - First paragraphs