Obiọma Maṱodzi
Tshedza Tlhako
Busisiwe Ndlovu

E nwere otu nwata nwaanyị aha ya bụ Maṱodzi.

Maṱodzi, nne ya na nnukwu nne ya bi n'otu obere obodo.

1

Otu ụbọchị, nne Maṱodzi gwara ya ka o wegara nwanne nne ya ozi n'obodo ọzọ.

"Soro ụzọ anyị na-ejikarị aga ebe ahụ", ka nne ya chetaara Maṱodzi.

2

Maṱodzi sooro ụzọ ahụ ọ maara nke ọma gaa n'ụlọ nwanne nne ya ma zie ya ozi ahụ.

Ka ọ na-alọta, ọ nụrụ obere olu nke nọ n'ebe dị nso na-asị, "Biko nyere m aka."

3

Maṱodzi lere anya gburugburu ma hụ otu nwaanyị ka o dina n'okporo ụzọ.

O kelere nwanyị ahụ ma jụọ ya, sị, " Gịnị mere i ji dinara ala ebe a? "

4

Nwaanyị ahụ zara, sị, "Adịghị m ike ma na-arịa ọrịa, ebe obibi m dịkwa anya n'ebe a'".

Maṱodzi nwere ọmịiko n'ebe nwaanyị ahụ nọ.

5

Ọ gwara nwaanyị ahụ, " M ga-akpọrọ gị gaa n'ụlọ m n'ihi na ọ dị nso. "

Maṱodzi nyeere nwaanyị ahụ aka ibili. Ha ji nwayọọ nwayọọ na-aga ije ruo mgbe ha rutere.

6

Maṱodzi na nne ya nakwa nnukwu nne ya lekọtara nwaanyị ahụ ruo mgbe ahụ dị ya mma.

7

Nwaanyị ahụ kelere ha nke ukwuu maka nlekọta ha lekọtara ya.

Ọ jara Maṱodzi mma maka inwe obi ike na obi ilekọta ndị ọzọ.

8

Nwaanyị ahụ gwara Maṱodzi na ezinụlọ ya si, " Agaghị m echefu ihe unu meere m.

Mgbe ụbọchị atọ gafere, achọrọ m ka ị kwụọ ihe ọchịchọ abụọ obi gi chọrọ "

9

Mgbe ụbọchị atọ gasịrị, Maṱodzi na nne ya nakwa nnukwu nne ya rịọrọ arịrịọ abụọ.

Ihe mbụ ha chọrọ bụ inwe ọmarịcha ụlọ.

10

Ihe ọchịchọ nke abụọ ha bụ ka e nwee ọhịa n'akụkụ ụlọ ha ka ha wee ghara ịga njem dị anya iji nweta nkụ.

Ihe ha abụọ chọrọ mezuru, dịka nwaanyị ahụ kwuru.

11

Maṱodzi na ezinụlọ ya biri n'obi ụtọ n'ụlọ ha mara mma nke dị n'akụkụ oke ọhịa.

12
You are free to download, copy, translate or adapt this story and use the illustrations as long as you attribute in the following way:
Obiọma Maṱodzi
Author - Tshedza Tlhako
Translation - Merit Ibekeme
Illustration - Busisiwe Ndlovu
Language - English
Level - First paragraphs