

Nwamba na nkịta bụ ezigbo enyi.
Ha kpebiri ịga leta enyi ha, nwa ọkụkọ n'ụbọchị ncheta ọmụmụ ya.
nwa ọkụkọ bi n'obodo ọzọ. Ọ ga-ewe nwamba na nkịta ụbọchị abụọ iji rute.
Nwamba na nkịta na-akpa àgwà n'ụzọ dịgasị nnọọ iche.
Nkịta na-enwe mmasị iri nri na ihi ụra, ọ na-emekwa ihe ọjọọ mgbe ụfọdụ.
Nwamba bụ onye obiọma, na-emesapụ aka, a pụkwara ịdabere n'ebe ọ nọ.
Ha zukọrọ n'ebe nkita bi iji hazie njem ha.
"M ga-eweta nri n' ụbọchị nke mbụ," ka nkịta kwuru.
" Aga m eweta nri n'ụbọchị nke abụọ, " ka Nwamba gbakwunyere.
Ha dere ihe niile ede ka ha ghara ichefu ya.
Ọ ga-abụ ihe obi ụtọ ịhụ nwa ọkụkọ n'oge na-adịghị anya. O teela anyị na-ahụbeghị enyi anyị, "Nkịta kwuru ka ọ na-eduga nwamba n'ụlọ ya.
"Imeela na ndupu I dupuru m rute n'ụlọ m ", ka nwamba gwara nkịta.
Ha zukọrọ n'isi ụtụtụ echi ya iji malite njem ha.
Ha na-abụ abụ ma na-agba egwu ọṅụ n'ụzọ ka ha n'eme ya bu njem.
Mgbe obere oge gasịrị, ha zuru ike n'okpuru otu nnukwu osisi. Nwamba wee kwụọ si, "Agụụ na-agụ m! Ka anyị rie nri"
Nkịta ji ọsọ wụnye nri n'efere abụọ. Nri ahụ di mmanụ mmanụ na mmiri mmiri.
Nwamba jụrụ, "Ọ bụ nri a ka i wetara anyị abụọ?"
Iwe were nwamba n'ihi na enyi ya ewetaghị nri ha kwekọrịtara na ha ga-eri. O righị nri nkịta.
"Gịnị ka i na-eche? " ka nkịta jụrụ. Ọ cheere na nwamba ga-akwụsị ime mkpesa ma rie nri.
N'iwe, nwamba jụrụ, "Gịnị mere i ji weta nri nke naanị gị na-amasị"
Nkịta na-eri nri ahụ ngwa ngwa nke na efere ya dapụrụ.
Nri nkịta niile ahụ wụsara n'ala.
Nwamba kwuo si, " Echegbula onwe gi enyi m,"
Nwamba wepụtara nri achịcha kachasị mma. Ọ malitere iri ya.
Nkịta jiri anya arịrịọ n'ele nri nwamba n'eri anya.
Mgbe nwamba richara nri, o chịkọtara ihe ya ma gwa Nkịta si, "Anyị enwere ike ịmalite njem anyị?"
Ha ekwusaraghị ibe ha okwu n'oge nile ha nọ na-eme njem ahụ. Agụụ gụrụ nkịta, afọ ya no n'eme nkpotu.
Na mgbede ahụ, nwamba kuuru nri rie naani ya. Ọ gara hie ụra na-enwe obi ụtọ nke ukwuu na o butere nri ga-ezuru ya.
Nkịta jiri agụụ gaa hie ụra .
N'ụtụtụ, nwamba tinyere onwe ya obere nri ụtụtụ. Nkịta no n'ele nri nwamba anya.
Nwamba gwara nkịta Ka ọ bia soro ya rie nri.
Nkịta kwuru sị, "Gbaghara m. M na-achọ naanị ọdịmma onwe m. "
Nwamba zara ya si, "Ka anyị rikọ nri ọnụ".
Ha nọdụrụ ala iri nri.
Ka ha nọ na-aga, ha ghọrọ enyi ọzọ!
Ha rutere n'ụlọ nwa ọkụko n'oge.
"Kedu otu njem unu siri gaa ndị enyi m" Ka nwa ọkụkọ jụrụ.
Ha abụọ lere onwe ha anya n'ihu ọchị , nwamba na nkita zara, "Ọ dị mma nke ukwuu".
Ọ bụ n'ezie nnukwu mmemme ncheta ọmụmụ.
Ha riri nri, gụọ egwu ma gbaakwa egwu!


