Ụlọ akwụkwọ Anyị Pụrụ Iche
Juwayiliya Bunaya
Yankho Jere

N'otu obere obodo dị na Malawi, e nwere otu ụlọ akwụkwọ pụrụ iche.

A na-akpọ ya Chiko. Nke a bụ aha mkpọbịrị ya nke pụtara ịhụnanya.

1

Ụlọ akwụkwọ anyị bụ ebe ana-enwe olileanya na ịhụnanya.

Ọ bụ ụlọ akwụkwọ maka ụmụaka ndị enweghi nne na nna dị ka m.

2

Okoko mara mma gbara ụlọ akwụkwọ anyị gburugburu.

E nwere ndị na-acha obara obara na-egbuke egbuke, nwekwara ndị na-acha odo-odo, ụfọdụ na-achakwa anụnụ anụnụ.

Ụlọ akwụkwọ anyị bụ ebe a na-enwe obi ụtọ.

3

Ndị na-arụ n'ụlọ akwụkwọ ahụ nyere anyị nri na uwe ụlọ akwụkwọ n'efu.

Nke a mere ka obi ruo anyị ala, meekwa ka anyị mata na a hụrụ anyị n'anya.

4

E wezụga ụlọ akwụkwọ a, agaghị m amata otu e si agụ ihe ọgụgụ na otu e si ede ihe.

Agaghịkwa m amụta otu e si agbakọ ọnụ ọgụgụ ma ọ bụ chọpụta akụkọ ndị na-atọ ụtọ n'akwụkwọ.

5

Ndị nkụzi na ndị ọzọ na-arụ n'ụlọ akwụkwọ anyị dị ka ezinụlọ anyị.

Ha mere ka anyị ghọta na anyị dị mkpa nakwa na a hụrụ anyị n'anya.

6

Ụbọchị ọbụla n'ụlọ akwụkwọ anyị bụ ahụmahụ ọhụrụ.

Anyị mụtara uru inyere ndị ọzọ aka bara, na ịjụpụta n'ekele maka ihe anyị nwere.

7

Ọ bughị naani ka e si agụ na ka e si ede ka ụlọ akwụkwọ ahụ kụziiri m, ọ kụziekwara m otu m ga-esi bụrụ ezigbo mmadụ.

O gosiri m na site n'ịhụnanya, obiọma, na agụmakwụkwọ, anyị pụrụ imeri ihe ọ bụla.

8
You are free to download, copy, translate or adapt this story and use the illustrations as long as you attribute in the following way:
Ụlọ akwụkwọ Anyị Pụrụ Iche
Author - Juwayiliya Bunaya, Zahira Suwedi
Translation - Ibekeme Merit
Illustration - Yankho Jere
Language - Igbo
Level - Longer paragraphs