Umu Nwoke Ise Ndị Nzuzu
Chuol Dow Wich
Kenneth Boyowa Okitikpi

N'otu oge, e nwere umu nwoke ise ndị nzuzu bi n'otu ụlọ. Ha na-ekerịta ihe niile onu.

Otu ụbọchị, ihe oriri ha gwụrụ. Ha kpọrọ nzukọ. "Kedu ebe anyị ga-esi nweta nri ọzọ anyị ga-eri?" ka otu n'ime ha jụrụ.

1

Azịza nye ajụjụ a adịghị mfe n'ihi na ha enweghị ego ma ọ bụ ndị enyi n'obodo ahụ.

Mgbe ha chebachaara echiche ma nkeji ole na ole, otu n'ime ha sịrị, "Ka anyị gawa." Onye nke abụọ jụrụ, sị, "Olee ebe?"

2

Onye nke atọ kwuru sị, "Iga zuo nri." Onye nke anọ jụrụ, sị, "Ọ̀ bụ na agaghị ejide anyị?" Onye nke ise sịrị, "Echegbula onwe gị banyere ya!"

Umu nwoke ise ahụ gara n'ahịa ịga zuru ihe ha ga-eri.

3

Ozugbo ha malitere izu ohi, e jidere ha!

A kpọgara umu nwoke ise ahụ n'ụlọ ọrụ ndị uwe ojii.

4

N'oge ndị uwe ojii na-eme nyocha na nchọpụta, ha jụrụ, sị, "Echiche onye ka ọ bụ izu ohi nri?"

Umu nwoke ndị a malitere igba izu n'etiti onwe ha. Ha mechaa gwa ndị uwe ojii otụ o si mee.

5

Onye nke mbụ kwuru, "M tụru aro naani ka anyị pụọ, ọ bụghị izu ohi." Onye nke abụọ kwuru, sị, "Enwere m mmasị ma jụọ ịmata ebe anyị na-aga."

Onye nke atọ kwuru, sị, "Anyị niile kwetara ịga chọọ nri."

6

Onye nke anọ kwuru sị, "M dọrọ onye ọbụla aka ná ntị na a ga-ejide anyị."

Onye nke ise asị, "Anyị niile maara na anyị bụ ndị ohi, ọ bụ ya mere m ji sị, 'Echegbula onwe gị banyere ya.'"

7

Mgbe ndị uwe ojii nụchara nke a, ha ghọtara na mmadụ ise ahụ nile so na-ezu ohi.

Onye uwe ojii ahụ kwubiri, sị, "Ọ dị mma ikekorịta ma ọ bụ ịkọrọ mmadụ ihe ọ bụla, ma e wezụga echiche ọjọọ!"

8
You are free to download, copy, translate or adapt this story and use the illustrations as long as you attribute in the following way:
Umu Nwoke Ise Ndị Nzuzu
Author - Chuol Dow Wich
Translation - Ibekeme Merit
Illustration - Kenneth Boyowa Okitikpi
Language - Igbo
Level - First paragraphs