

N'otu obodo, e nwere otu ọmarịcha nwa nwaanyị aha ya bụ Ella.
O toro ogologo, bia di oji, ntutu isi ya na-ejikwa oji. O nwere anya na-adọta mmadu.
Ella nwere ezé mara mma ma n'emuke emuke. Ọ bụ nwata nwaanyị nwere obiọma ma na-arụsi ọrụ ike. Ọ dịghị mgbe ọ nyere nne na nna ya nsogbu.
Naanị ihe na-ewute nne na nna ya bụ oke ajụjụ ọ na-ajụ iji mata ihe. Ọ na-ajụ ajụjụ ndị pụrụ iche.
Dị ka imatụ, mgbe pensụl ya gbajiri, Ella jụrụ nne ya, sị, "Mama, pensụl m ọ gara eluigwe?"
Ọtụtụ ajụjụ Ella n'aju na-agwụ nne na nna ya ike mgbe ụfọdụ. Ya mere, ụfọdụ oge ha na-eleghara ya anya.
N'agbanyeghi, nwanne Ella nke nwoke, bụ Henry, na-egekarị ntị mgbe nile n'ajụjụ Ella na-ajụ. Mgbe mmiri na-ezo, ọ jụrụ, sị, "Mmiri ozuzo nke dị n'urukpu, ọ na-ebe ákwá?"
Nwanne ya nwoke chịrị ọchị ma za ya "Mba!" Ọ gara n'ihu ịkọwa na mmiri ozuzo na-ezo mgbe nkpụrụ mmiri dị na mbara igwe jụrụ oyi.
Otu ụbọchị, o kpebiri ịga nlegharị anya. Ka ọ na-aga ije, ọ hụrụ osisi apụl ma kụjie alaka ya n'amaghị ama.
"Chei, mba! Ọ chọrọ dọkịta," ka Ella kwuru. N'ịtụnanya, osisi ahụ zara si, "Ee, achọrọ m ịhụ dọkịta."
Nke a wụrụ Ella akpata oyi n'ahụ, ọ wee jụọ, sị, "Kedu otú i si nwee ike ikwu okwu?" Osisi ahụ zara, sị, "Abụ m osisi nke pụrụ ịza ajụjụ gị nile."
Ella jụkwara ya ọzọ, sị, "Gịnị mere nwata nwoke ahụ enweghị ike ịnụ ihe ị na-ekwu?" Osisi ahụ zara ya, sị, "Ọ bụ n'ihi na ọ jụghị m ajụjụ ọbụla."
Ella gbaara ọsọ gakwuru nwanne ya nwoke ma kọọrọ ya ihe merenụ. Ha abụọ gbagara n'osisi ahụ ngwa ngwa. Henry jụrụ, sị, "Ị̀ dị ire n'ezie?"
Osisi ahụ zaghachiri, sị, "Adi m ire." Ha abụọ gbara egwu ọṅụ.
Site n'ụbọchị ahụ gawa, ha anaghịzi enye nne na nna ha nsogbu ozo.
Mgbe ọ bụla ha nwere ajụjụ, ha na-agakwuru osisi apụl ahụ, ọ na-azakwa ajụjụ ha.

