

Terna bụ nwoke na-enweghị ebe obibi. Ọ na-achọkarị mkpụrụ osisi ọ ga-eri n'oke ọhịa.
Mgbe ụfọdụ, ọ na-arahụ n'ebe ahụ. Adáká na ọzọdimgba na-ele ya anya site n'osisi na ahịhịa di n'ime ọhịa ahụ.
Ọ na-awagharị n'ime ọhịa wee hụ ọtụtụ osisi.
"Osisi ndị a nọ ebe a na-ala n'iyi," ka o chere n'echiche.
Mgbe ike ngagharị gwụrụ ya, ọ nọdụrụ ala, dabere n'otu n'ime osisi ndị ahụ ma hie ụra.
Osisi ndị ahụ na-echekwa ya n'ebe anyanwụ nọ, ebe ụmụ nnụnụ na-efe n'elu osisi ahụ ma na-abụ abụ ọma.
O nwere ihe gbatara ya n'uche.
"Ọ bụrụ na m egbutuo ụfọdụ osisi ndị a, apụrụ m ịkpata ego ma ghọọ onye nwe ọtụtụ nnukwu ụlọ."
Ọ gara n'ime obodo wee gbaziri ihe eji egbutu osisi. Ọ malitere igbutu osisi ndị ahụ.
Ọzọdimgba rịọrọ ya, sị, "Biko, egbutula osisi ndị a. Ha bụ ebe obibi anyị na nke ụmụ nnụnụ ndị a. Mkpụrụ osisi ndị a bụ nri anyị."
Terna kwuru, sị, "Achọrọ m ego iji ruo ụlọ nke m."
"Ọ bụ ịchọ ọdịmma naanị onwe gi, imebi ebe obibi nke ọtụtụ ụmụ anụmanụ na nnụnụ iji mee ebe obibi nke gị," ka ọzọdimgba ahụ kwuru.
Terna nwere nwute. Ọ tụpụrụ ihe ahụ o ji egbutu osisi ma makụọ ọzọdimgba ahụ.
Enyi ya, bụ ọzọdimgba, tụụrụ ya aro na ya pụrụ iji ụrọ mee brik. Jirizie ahịhịa na osisi nwụrụ anwụ rụọ ụlọ ata ya.
N'ụzọ dị otú ahụ, ha abụọ pụrụ inwe ebe obibi.
Terna kwetara. Ọ na-agakarị eleta ọzọdimgba ahụ oge ọbụla.
Ọzọdimgba ahụ nyere ya ohere ịghọrọ ọtụtụ mkpụrụ osisi na osisi ndị nwụrụ anwụ dịka Ọ nwere ike.
Ha ghọọrọ ezigbo enyi.

