

Madina bụ ada (nwa nwaanyị nke mbu) n'ezinụlọ Karembe.
Ezinụlọ a bi na Bandiagara.
Otu mgbede, Madina gara imechi ụzọ.
O hụrụ otu nwata nwaanyị na otu nwa nwoke.
O juru Madina anya ịhụ ụmụaka abụọ ọ na-amaghị.
Ọ kpọrọ nna ya òkù, sị, "Papa! Papa ! Enwere umụaka abụọ nọ n'ọnụ ụzọ."
Nna ya gbagara n'ọnụ ụzọ.
Mgbe ọ hụrụ ụmụaka ahụ, ọ jụrụ, sị, "Kedu ndị unu bụ? Kedu ebe unu si?"
Nwata nwoke ahụ kwuo si, "Abụ m Assama, nke a bụ obere nwanne m nwaanyị, Yakôrômo."
Assama na Yakôrômo yiri ndị ike gwụrụ, ndị ụjọ na-atụ na ndị obi adịghị mma.
Assama gara n'ihu ịkọwa, "Anyị si n'obodo Songho bia, nke dị n'ime ime obodo Doucombo."
Nke a wụrụ papa m akpata oyi n'ahụ́ nke na ọ maghịzi ihe ọ ga-ekwu.
Madina sịrị, "Papa, hapụ ha ka ha bata. Ike gwụrụ ha nke ukwuu, agụụ na-agụkwa ha. Anyị dị ha mkpa."
Yakôrômo kwuru okwu nke mbụ si.
"A wakporo obodo anyị. Nne na nna anyị nwụnahụrụ anyị. Ihe niile funahụrụ anyị."
Ọ gara n'ihu na-ekwu okwu n'obere olu.
"Anyị no na-agaghari kemgbe ụbọchị ole na ole gara-aga. Anyị amaghị ebe anyị ga-aga ma ọ bụ ihe anyị ga-eme."
Mgbe ahụ, papa m ji obi ụtọ makụọ ụmụaka ahụ.
"Batanụ, ụmụaka, ebe a bụ ebe obibi unu. Anyị ga-ekwu maka ya mgbe unu zuchara ike," ka papa m kwuru.
Ụmụaka ahụ sonyeere ezinụlọ ahụ rie nri abalị, nri mbụ na-ekpo ọkụ ha riri kemgbe ọtụtụ ụbọchị.
Mgbe nke ahụ gasịrị, Madina kpọgara Assama na Yakôrômo n'ime ụlọ ha.
Site n'ụbọchị ahụ, a na-ewere Assama na Yakoromo dị ka ndị si na ezinụlọ KAREMBE.
Ha na ụmụaka ndị ọzọ na-egwuri egwu, ma na-arụkwa ọrụ niile dị n'ụlọ.

