

Ndị mmadụ na-ebi n'ụdị ụlọ dịgasị iche iche. Ụfọdụ ndị na-ebi n'ụlọ dị oke elu. Ndị ọzọ na-ebi n'ụlọ ndị dị ala.
Ụlọ ndị dị elu nwere ike inwe ọtụtụ ụlọ ndị a rukwasịrị n'elu ibe ha. Akwụkwọ a na-ekwu banyere iru nnukwu ụlọ elu nwere ọtụtụ ụlọ n'elu ya.
Mishelle na Catherine bụ ụmụnne. Ọ fọrọ obere ihe ka Mishelle gụchaa ụlọ akwụkwọ sekọndrị. Catherine nọ n'afọ ikpeazụ nke ụlọ akwụkwọ praịmarị.
Ụmụnne a na ndị muru ha tinyere nne nne ha ochie bi n'otu ụlọ dị oke elu dị na Nairobi. Ha na-enwe mmasị ibi ebe dị elu n'elu obodo, dị ka nnụnụ ndị nọ n'osisi kasị elu.
Ezinụlọ a bi n'otu ụlọ elu nke iri abụọ na abụọ n'ime ụlọ elu a. Ha na-eji igwe mbuli aga n'ebe obibi ha.
Catherine na-agụkari ụlọ elu arụkwasara n'elu ibe ya ọnụ ka ha na-arịgo elu ma na-agbadata n'ala. Ọ chọrọ ịbụ ọkwọ ụgbọelu otu ụbọchị. Mishelle chọrọ ịbụ injinia ma rụọ ụlọ elu ọgbara ọhụrụ dị oke elu.
Catherine jụrụ sị, "Ụlọ anyị ọ̀ bụ ụlọ kasị elu n'obodo Africa?"
Mishelle zara sị, "Ee e, ụlọ a dị ihe dị ka mita otu nari, iri abụọ na isii n'ogo elu. Ụlọ kacha di elu n'Africa dị nanị ihe karịrị mita nari atọ, iri ịtoolu na atọ. Ụlọ kasị elu n'ụwa dị ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mita nari asatọ na iri atọ!"
"Eeehee! Olee otú ụlọ ndị dị otú ahụ dị elu si nọgide ma guzosie ike?" ka Catherine chere.
"N'eziokwu, ọ bu otu ụsọro ka esi arụ ụlọ elu kacha elu ọgbara ọhụrụ niile. Ihe abụọ kacha mkpa e ji arụ udi ụlọ a bụ ígwè na kọnkrịti.
A na-arụ ụlọ ọgbara ọhụrụ a dị oke elu site n'ịrụ ụlọ elu n'elu ibe ya n'otu n'otu, a na-amalite site n'itinye ígwè ma were simenti gbaa ya gburugburu. Ihe ndị a na-eme ka ụlọ a sie ike ma nnọọ ogologo oge," ka Mishelle zara.
Iji ruo ụlọ ọgbara ọhụrụ di oke elu, ndị na-aru ụlọ ga-ebu ụzọ gwuo olulu miri emi maka ntọala ụlọ ahụ.
Dị ka osisi toro ogologo na-enwe mgbọrọgwụ ndị buru ibu ma dị omimi, otú ahụkwa ka ụlọ elu ọgbara ọhụrụ di oke elu ga-enwerịrị ntọala siri ike n'elu oké nkume. Mgbe ụfọdụ, nkume ndị ahụ na-adị n'ime ala.
Ihe ọzọ n'eso ya bụ, ndị ọrụ ga-arụ ụlọ nkwado ụlọ ahụ. Ha na-eji iberibe ígwè di ogologo ogologo wee na-arụ ụlọ nkwado ahụ.
Ụlọ nkwado eji ígwè rụọ na-enye aka iru ụlọ di oke elu. Ìgwè nwere ike ibu nnukwu ibu.
Ụlọ nkwado eji ígwè rụọ bụ isi sekpụ ntị dị n'ụlọ ahụ, dị ka ọkpụkpụ mmadụ.
Ìgwè nwekwara ike igbagọ agbagọ. Ọ pụtara na ụlọ nwere ike ịmegharị ntakịrị (n'agbanyeghị na ọ siri ike ịhụ udi a).
Ọ bụrụ na e nwee oké ikuku, ma ọ bụ ala ọma jijiji, ígwè e ji ruo ụlọ a ga-eme ka ụlọ ahụ kwurụ chịm. Ma ọbụrụ godi na ọ maa jijiji obere,
Ìgwè na-eme ka o sie ike.
Ihe ọzọ di mkpa eji arụ udi ụlọ a bụ kọnkrịtii. Konkriti bụ ngwọkọta ihe dị ka ájá, simenti, na mmiri.
Ndị ọrụ na-agwọkọta konkriti iji nwee ntechi dị arọ, bụ́ nke ha na-awụnye na gburugburu akpụkpọ ụlọ ahụ.
Mgbe konkriti ahụ kpọrọ, ọ na-esi ike dị ka nkume. Nke a na-emebe ala na ahụ ụlọ ahụ.
Ndị ọrụ na-arụli udi ụlọ elu a site na irụkwasị ụlọ n'elu ibe ya n'otu n'otu. Ụlọ ndị dị n'ala ga-agbasị ike iji kwado nnukwu ibu.
Konkriti e ji rụọ ya na-eme ka ụlọ sie ike ma kwụsie ike.
Konkriti ahụ e ji rụọ ya bụ ihe e ji kpuchie ígwè ahụ, nke na-eme ka mmiri na ikuku ghara ịbanye na ya. (Mmiri na ikuku na-eme ka ígwè mebie.)
A na-arụkwa oghere nke na-ebuli ihe elu n'oge a. Mgbe a rụchara ígwè na konkriti ahụ, ndị ọrụ ahụ na-etinye ọnụ mpio. Mgbe ahụ, ha na-agbakwunye elu ụlọ na mgbidi ma a rụchaa ala ụlọ ahụ.
Ugbua a ga-etinye waya eletrik na ụzọ mmiri si apụ maka mmiri ịpụ na idebe ihe ọcha.
N'ikpeazụ, ndị ọrụ na-etinye ọkụ, ọnụ ụzọ, kabọdu, na ihe ndị ọzọ eji ebi mana arụkwa ọrụ n'ụlọ elu ọgbara ọhụrụ dị oke elu.
Mishelle kwuo sị, "Ọtụtụ nnukwu obodo adịghịzi enwe ohere. Ụlọ elu dị elu na-enye oghere n'ala. Mgbe m ga abụ injinia, aga m enye aka rụọ ụlọ ọgbara ọhụrụ kacha elu n'ụwa!"

