Anyị Bi N'ụlọ Gbara Okirikiri
Nina Orange
Vusi Malindi

Ndị mmadụ na-ebi n'ụdị ụlọ dịgasị iche iche. E ji ihe ndị sitere n'okike, dị ka ahịhịa, arụ ụfọdụ ụlọ. A na-eji ihe ndị mmadụ mepụtara, dị ka iji ugogbe eji arụ ụlọ na kọnkiriti, arụ ụlọ ndị ọzọ.

A na-eji ma ihe ndị sitere n'okike ma ihe ndị e mepụtara emepụta arụ ụfọdụ ụlọ, dị ka ụlọ gbara okirikiri dị n'akụkọ a.

1

Kabo na Thabo bi na mpaghara Kgatleng nke Botswana, dị nso n'obodo Mochudi. Ha na nne na nna ha bi na ụlọ gbara okirikiri.

Kabo kọwara, sị, "Ụlọ gbara okirikiri bụ ụlọ agba ochie e ji gbamgbam ahịhịa arụ elu ya. A na-arụ udi ụlọ ndị a n'ọtụtụ akụkụ nke ndịda Africa."

2

Thabo gara n'ihu kwuo, sị, "Ọtụtụ ụdị ụlo a na-adi gburugburu, ha na-enwe ọnụ ụzọ na ọnụ mpio. Anyị nwere ọnụ mpio ndị e ji ugogbe mee, nke enweghị n'oge ochie."

"Nna nna anyị ruru ụlọ ndi gbara okirikiri a n'ụzọ agba ochie. Nna anyị gbakwunyere ụfọdụ ihe ọgbara ọhụrụ," ka Kabo kwuru.

3

Kabo chere, sị, "Ka anyị kọwa usoro eji arụ ụlọ a."

Ọ kwuo, sị, "Ndị na-arụ ụlọ na-eji osisi, ahịhịa, nkume, na ntụ nrapụta rụọ ya.

Ihe mbụ ha na-eme bụ igwu olulu. Ha na-eji obere okwute, ájá nkiti na aja ụlọ ekpuchi olulu ahụ ha gwuru. Nke a na-eme ka ụlọ ahụ nwee ntọala siri ike aga arukwasị ihe n'elu ya."

4

Thabo gara n'ihu kwuo, sị, "Ndị na-ewu ụlọ ahụ na-agbanye osisi ndị toro ogologo n'ime ntọala ahụ, n'akụkụ ya dị n'èzí. Ha na-ejikọta osisi ndị ahụ ọnụ ma jiri ha na-arụ mgbidi dị n'èzí.

Ozugbo a rụchara mbido na nguzobe nke ụlọ ahụ, ndị na-arụ ụlọ na-ejikọta okwute ndị e ji ruo ya ekekọta ya ọnụ n'ime ntọala osisi ahụ."

5

"Ihe ozo n'eso ya bụ, ndị na-arụ ụlọ na-agwakọta ụrọ, mmiri, na nsị ehi. Nke a na-eme ka ihe e ji akpụ ájá sie ike nke ukwuu mgbe ọ kpọnwụrụ akpọnwụ. Ha na-agbanye ụrọ ahụ n'etiti nkume ndị ahụ iji dozie ha otu ọ kwesriri," ka Kabo kwuru.

"Iji nkume na ụrọ ruo ụlọ na-eme ka mgbidi ụlọ ahu sie ike ma dirukwa ogologo oge," ka Thabo gbakwụnyere.

6

Kabo kwuru si, "Ahụ mgbidi ụlọ anyi na-egbochi ụlọ okirikiri anyị idi oke oku."

Thabo kọwara, sị, "Igbochi ya pụtara na ime ụlọ na-anọ jụụ mgbe ihu igwe na-ekpo ọkụ n'èzí. Okpomọkụ anyanwụ apụghị ịba n'ahụ́ mgbidi ndị ahụ.

N'ebe ufodu oyi na-atụkarị, ihe mgbochi a na-eme ka ụlọ a gbara okirikiri na-ekpo ọkụ n'oge oyi site n'ime ka ekpomọkụ di n'ime ya."

7

"Ndị na-arụ ụlọ na-arụ ala ụlọ okirikiri anyị site n'itinye apịtị n'ime ntọala ha ruru," ka Thabo kwuru.

Kabo kwuo, sị, "Iji ruchaa ala ụlọ ahụ, ha na-agbasa apịtị nke ikpeazụ ma tinye ya n'ala. Nke a ga-akpọ nkụ ọfụma ma mepụta ala dị larịị."

8

Thabo kwuru si, "Ihe ikpeazụ bụ itinye elu ụlọ. Ụlo ndi gbara okirikiri na-enwekarị elu ụlọ gbamgbam ahịhịa a kapịrị ọnụ.

Ndị na-arụ ụlọ na-emekwa okporo osisi ejikọtara ọnụ n'otu ebe n'etiti ya. Ha na-adụkọta ùkwù ahịhịa n'osisi ndị ahụ n'ígwé. N'ihi ya, elu ụlọ eji gbam gbam ahịhịa rụọ anaghị ebu mmiri."

9

Elu ụlọ ahịhịa bụ ihe bara uru iji arụ elu ụlọ. Nke a bụ ihe si na okike ma na-emepụtakwa ezigbo ụlọ ebe ụmụ ahụhụ na ụmụ anụmanụ ndị ọzọ n'ebi. Ọtụtụ n'ime ha bụ ụmụ ahụhụ!

Legodị ihe osise a ma hụ: ududo atọ, akpị, ebeji, akika, na òké?

10

Ihe ndị si n'okike dị ka gbamgbam ahịhịa eji arụ elu ụlọ na-eme ka gburugburu ụlọ buru ebe dị mma, ebe ududo ga-ebi ma na- achụ nta.

Ududo anaghị emebi ahịhịa eji rụọ elu ụlọ, ha na-enyekwara ya aka ịchịkwa ụmụ ahụhụ ndị ọzọ.

Anyị kwesịrị idina elekọta gbamgbam ahịhịa elu ụlọ anya iji gbochie ụmụ anụmanụ na-emebi ihe dị ka òké, àkpị, na akika.

11

"Anyị di ọtụtụ bi na ụlọ a gbara okirikiri!" kaThabo kwuru, na-ele anya na ahịhịa eji rụọ ụlọ ahụ. Ọ na-atụ ududo ụjọ.

"M na-eche umu anụ ndị ọzọ bi na gburugburu anyị?" ka Kabo ji ụjọ jụọ.

"Mgbe m rụọ ụlọ nke m, m ga-arụ ụlọ gbara okirikiri eji taili rụọ elu ya!" ka Kabo kwuru n'ọchị.

12
You are free to download, copy, translate or adapt this story and use the illustrations as long as you attribute in the following way:
Anyị Bi N'ụlọ Gbara Okirikiri
Author - Nina Orange, Ursula Nafula
Translation - Ibekeme Merit
Illustration - Vusi Malindi
Language - Igbo
Level - Read aloud