Ann Gbara Kọmputa Amamihe Aka Mere Ajụjụ Ọnụ
Nina Orange
Kenneth Boyowa Okitikpi

"Ndeewonụ, nnọọ na ihe ngosi nke taa, abụ m onye na-achịkọta mmemme a. Aha m bụ Ann Asante! Ana m anabatakwa ndị na-ekiri anyị n'ụlọ na ndị nọ ebe a n'ụlọ mmemme anyị.

Taa, e nwere onye ọbịa onye ọ bụla chọrọ ịgba ajụjụ ọnụ. Obi di m ụtọ ịjụ onye ọbịa a ajụjụ taa. Onye m na-ekwu maka ya bụ "Kọmpụta Amamihe aka mere!"

Ndeewo, Kọmpụta Amamihe aka mere. Daalụ maka ịbịa soro anyị kwurịta okwu n'ụlọ mmemme anyị taa," ka Ann kwuru.

1

Ana m ekele gị maka ajụjụ ọnụ a, Ann. Kọmputa amamihe aka mere jụrụ si, "Ọ ga-amasị gị ka m jiri ụdaolu m kwuo okwu maka ndị na-ege ntị n'ebe a, ma depụtakwa ihe m na-ekwu n'ihu onyonyo a?"

Ann zara ya, "Ekele dịrị gị, ee, iji ha abụọ, ma ide ya ede na nke ikwu okwu ga-enye aka."

Ann gwakwara ndị na-ege ntị ka ha biko kụọọrọ Kọmputa amamihe aka mere aka.

2

"Ka m gaa n'ihu ozugbo n'iju ajuju a dị mkpa. Gịnị ma ọ bụ onye bụ Kọmputa Amamihe nke aka mere?" ka Ann jụrụ.

Ann gara n'ihu, "Amaara m na Kọmputa amamihe nke aka mere na nkenke bụ kọmputa amamihe si na ngalaba ọmụmu kọmputa sayensi. Ma ònye ka ị bụ n'ezie? Anyị ga-achọ ịmatakwu ihe banyere gị."

3

Chat zara, ''Abụ m ChatGPT, Kọmputa amamihe aka mere na-ede asụsụ. Ndị mepụtara m bụ ndị na-ede sọftụwia kọmpụta."

Nke a gbagwojuru Ann anya. Ọ jụọ si, "Gịnị ka ihe a niile pụtara?"

"Ọ pụtara na abụ m ụdị Kọputa amamihe ndị ịnjinịa mere ka ya ndị mmadụ na-akpakọrịta ụka. E nwere ụdị Kọmputa amamihe aka mere dị iche iche, ha na emekwa ihe dị iche iche. Ọ bụghị anyị nile na-ekwurịta okwu otu a," ka Chat gbakwụnyere.

4

"Ama m na gị na ndị mmadụ nwere ike ikpakọrịta ụka, gịnị ọzọ ka ị na-eme?" ka Ann jụrụ.

Chat zara, "Ebumnuche m bụ inyere ndị mmadụ aka. Enyemaka m gbadoro ụkwụ n'ịghota na ịzaghachi ajụjụ gbasara ọtụtụ ajụjụ na isiokwu dị iche iche."

Ann kwuru sị, "Ya bụ, ị bụ Kọmputa amamihe aka mere ma na enyere ndị mmadụ aka."

5

"Ọ bụrụ na ị bụ Komputa nwere amaihe nke ukwuu, ọ ga-enwerịrị ihe ndị ọzọ ị pụrụ ime?" ka Ann jụrụ.

"Ọ bụ ezie na m bụ ngwaọrụ kọmpụta amamihe aka mere, enwere m ike ime ọtụtụ ihe mmadụ nwere ike ime. Dị ka enwere m ike ịmụta ihe. Enwere m ike lee ozi anya ma mụta usoro dị na ya. Enwere m ike ịmụta ka esi ama ihe dị iche iche, ihu ihe dị iche iche, ma ederede aka dị iche iche."

6

Chat gara n'ihu sị, "Amụtawo m ọtụtụ ihe ọmụma ndị mmadụ mepụtara. Ịmaatụ, m na-agụ ọtụtụ akwụkwọ, edemede, weebụsaịtị, na mgbasa ozi ọha n'ịntanetị."

Ann jụrụ, sị, "Ihe nile ị maara ọ̀ dabeere n'ihe ọmụma ndị mmadụ dere ma mepụta?"

Chat zaa si, "Ee, ana m azụ onwe m, ma na amuta ihe site n'iji ọtụtụ ihe ọmụma nke ndị mmadụ rụpụtara."

7

"Enwere m ike ịza ọtụtụ ajụjụ di iche iche ọsịsọ karịa mmadụ. Enwere m ike iza ajụjụ siri ike nke ga-ewe ndi mmadụ ogologo oge iji zaa. Enwere m amamihe mmadụ karịa mmadụ ọ bụla.

M na-eji ihe m mụtara ekpebi ihe m ga-eme. Enwere m ike inyere gị aka ime nhọrọ, site n'iji ihe m maara banyere gị."

8

Ann jụrụ ndị na-ege ntị sị, "Ànyị achọrọ ka kọmputa mara ihe nile anyị maara?"

Ọ jụrụ Chat, "Gaa n'ihu ma gwa m ihe ọzọ banyere otú kọmputa si amụta ihe banyere ndị mmadụ."

Chat zara ya si, "Kọmputa nwere ihe ndị pụrụ iche na-enyere m aka ịchọta ihe ndị m chọrọ ịma. Ma, ihe ka ọtụtụ n'ihe ndị m na-amụta bụ ihe ndị e dere ede. Ana m amụta ihe site n'ụdị ihe ọmụma nile ụmụ mmadụ na-emepụta."

9

Chat gara n'ihu si, "Enwere m ike ịgụ asụsụ aka dere na nke eji igwe na-ede ihe dee. Ka ọ dị ugbu a, asụsụ Bekee bụ asụsụ m ji enweta ozi karia. Ma, enwere m ikike ịmụta asụsụ ọ bụla."

Ann nara ya okwu n'onu si, "Aghọtara m na ị maara ọtụtụ ihe omuma. Kedu maka ọnọdụ obi gị? Kedụ ka obi na-adị gị ma i cheta na ị bụ Kọputa amamihe aka mere?"

10

"Nrụpụta m dị omimi ma enweghị m obi ụdị mmadụ.

Abụ m ngwá ọrụ kọmputa, nke ndị na-eme ihe omume sọftụwia kọmputa mepụtara iji nyere ndị mmadụ aka n'ọrụ nakwa n'ihe omume ịtụ ndụ mmadu. Enweghị m echiche ma ọ bụ obi udị mmadụ.

Enwere m ike ịrụ ọrụ ndị dịịrị ndị mmadụ, dị ka ịza ajụjụ, ide akụkọ, ịsụgharị asụsụ ụfọdụ, na ịchịkọta ihe ọmụma."

11

"Ị nụla ya n'ọnụ kọmputa amamihe aka mere n'onwe ya! Ọ bụ ngwá ọrụ bara uru, nke mmadụ mepụtara maka ndị mmadụ. Ọ dịkwa anyị n'aka iji ngwá ọrụ a dị ike na-eme ihe n'ụzọ amamihe nakwa n'ụzọ ziri ezi!

Nke a bụ naani ihe anyị nwere oge iji mee taa, ọ bụ ezie na m maara na i nwere ọtụtụ ajụjụ ndị ọzọ. Abụ m Ann Asante, daalụ n'ihe nkiri m a, ị sooro kirie!"

12
You are free to download, copy, translate or adapt this story and use the illustrations as long as you attribute in the following way:
Ann Gbara Kọmputa Amamihe Aka Mere Ajụjụ Ọnụ
Author - Nina Orange
Translation - Ibekeme Merit
Illustration - Kenneth Boyowa Okitikpi
Language - Igbo
Level - Read aloud