

Ndị mmadụ na-ebi n'ụdị ụlọ dịgasị iche iche. Ụfọdụ ndị mmadu na-ebi n'ụlọ ndị a rụrụ ka ha nọruo ogologo oge. Ndị ọzọ na-ebi n'ụlọ ndị na-adịru nwa oge, ndị na-adịghịkwa adịte aka.
Akwụkwọ a bụ banyere ebe obibi adịghị adịte aka nke bụ ụlọ obibi nwere ọtụtụ ụlọ ma nwee otu ogige gburugburu ha. Ụlọ jụpụtara n'ogige a bụ ụlọ ata ndị gboo.
Udi ụlọ obibi a nwere ọtụtụ ụlọ ma nwee otu ogige gburugburu ha dị n'ebe ugwu-etiti Kenya, na Samburu County. Ụmụnne nwaanyị abụọ, Sidai na Naeku bi n'otu ụlọ, ebe nne na nna ha na nwanne ha nwoke nke obere bikwa n'otu ụlọ ata.
Nwanne nna ha na ụmụnne ha ndị nwoke atọ tọrọ ha tinyere ezinụlọ ha bi n'ụlọ ata ndị ọzọ.
Ezinụlọ ndị a na-azụkọta ehi ha ọnụ ma na-enyere onwe ha aka. Ha anaghị anọte aka n'otu ebe. Ha na-agagharị iji chọta ebe ọhụrụ ozo ehi ha ga-ata nri.
E ji anaka osisi dị ogwu ogwu gbaa ụlọ ndị ahụ gburugburu. Ogige a na-eme ka ehi nọrọ n'ime ya ma ghara ịgbapụ. Ọ na-emekwa ka ndị ozo bụ ndi bịara abịa ghara ịbata n'ime ya.
Sidai kwuru si, "Anyị na-amalite iru ụdị ụlọ a site n'ịchịkọtasi ihe ndị eji arụ ya dị na gburugburu anyị. Anyị na-achịkọta anaka osisi iji ruo ụlọ bụ mbido na nguzobe nke ụlọ."
Naeku wee gbakwụnye, sị, "Anyị maara otu e si eji ihe ndị chukwu kere arụ ụlọ anyị. Onye ọ bụla bi n'ụlọ ndia agbara ogige na-enye aka n'iru ụlọ ohuru n'ime ogige ahụ."
Sidai kọwara si, "Anyị na-eji nnukwu anaka osisi mee ka mgbidi ahụ bụrụ ihe siri ike. Anyị na-eji ihe e ji arị elu ekekọta okpokoro elu ụlọ ahụ na mgbidi ahụ, iji mee ka ụlọ ahụ niile sie ike."
Naeku kwukwara. "Ụlọ ndị ahụ nwere mgbamgbam ụlọ dị ala, nke na-eme ka o siere ikuku ike ibughari ha."
Sidai gara n'ihu kwuo, sị, "Ozugbo ntọala ụlọ ata ahụ guzoro, anyị na-akpa anaka osisi ndị dị gịrịgịrị n'etiti anaka osisi ndị buru ibu."
Naeku gbakwụnyere sị, "Anyị na-emepụta ahịhịa dị ukwuu ma kee ha n'elu ụlọ. A na-akpọ nke a mgbagbam ahịhịa."
Sidai kwukwara, "Ezigbo gbamgbam ahịhịa na-echekwaba anyị n'aka mmiri ozuzo na anyanwụ."
Sidai kwuru si, "Elu ụlọ nke ụlọ anyị nwere ike ịdị larịị ma ọ bụ gbaa gburugburu."
Naeku kwuo, sị, "Itechi ahụ ụlọ bụ nke kacha amasị m. Anyị na-agwakọta apịtị na nsi ehi ọnụ iji mee ihe e ji etechi ụlọ. Anyị na-etinye ude ntechi a n'ime mgbidi ahụ, ma mejuo oghere ndị dị na ya. Nke a na-enye aka ime ka ikuku na ájá ghara ịbata."
Sidai gara n'ihu kwuo, sị, "Itinye ihe eji etechi ụlọ n'ime mgbidi na-eme ka ha nọkọọ ọnụ mgbe ha kpọnwụrụ. Anyị na-etechikwa elu mgbidi ahụ. Ihe eji etechi ụlọ kpọrọ nku na-esi ike."
Naeku gbakwụnye, sị, "Mgbidi ụlọ anyị enweghị ọnụ mpio, ma ọ nwere ọnụ ụzọ e ji osisi rụọ."
Sidai kwuru, ''Ịtechi mgbidi na-anagide ọnọdụ ụlọ, ọ na-eme ka ọ ghara ịdị ọkụ ma ọ bụ jụọ oke oyi." "Gịnị ka nke a pụtara?" ka Naeku jụrụ."
Mgbidi ndị e ji apịtị na nsị ehi rụọ na-eme ka ụlọ ahụ jụọ oyi n'ime mgbe okpomọkụ dị n'èzí. Ma mgbe oyi dị, mgbidi ahụ na-eme ka anyị nwee okpomọkụ si n'ọkụ anyị na-aṅa n'ime ụlọ," ka nwanne ya nwaanyị zara.
"Onye ọ bụla bi n'ụlọ ndị a agbara ogige na-enye aka n'ịrụ ụlọ, anyị niile na-enyekwara aka ịkwatu ụlọ ahụ mgbe anyị na-akwapụ."
Ọ sighi ike ịkwatu ụlọ ndị ahụ ma jiri ihe ndị ahụ ruo ụlọ n'ebe ọhụrụ ọzọ," ka Sidai kọwara.
"Ihe ndi anyị ji arụ ụlọ adịghị arọ, ya mere, ọ dị mfe ibugharị ha. Anyị na-eji ịnyịnya ibu ma ọ bụ jakị. Ebute ihe ọ bụla bara uru site na ụlọ ochie anyị. Dị ka, mgbamgbam ụlọ e ji ahịhịa mee," ka Sidai kwuru.
Naeku gbakwụnyere, sị, "Anyị nwekwara ike ịchịkọta ihe ndị ọzọ anyị ga-eji rụọ ụlọ n'ime ebe obibi ọhụrụ ahụ."
Sidai kwuru, sị, "Ụlọ anyị dabara n'otú anyị si ebi ndụ, nke bụ́ iso ìgwè ehi anyị na-agagharị agagharị."
"Ịgaharị n'ebe dị iche iche pụtara na anyị agaghị eso ndị enyi anyị aga ụlọ akwụkwọ," ka Naeku kwuru.
Sidai gbakwụnye, sị, "Ụlọ akwụkwọ anyị na-ekwe ka anyị gbaziri akwụkwọ, anyị na-agbalịkwa ime ihe omume ụlọ akwụkwọ anyị."

