Anyị Bi N'ụlọ Akika
Nina Orange
Kenneth Boyowa Okitikpi

Ụmụ ahụhụ na-ebi n'ụdị ụlọ dị iche iche. Ụfọdụ ụmụ ahụhụ na-ebikọ ọnụ na nnukwu ìgwè, ụfọdụ na-ebi naanị ha.

Akụkọ a bụ banyere Naeku na Naserian - ụmụnne abụọ bụ́ akika bi n'ụlọ akika nke dị n'ebe ndịda Kenya.

Ụmụnne nwanyị abụọ a bi n'otu ógbè nke ihe dị ka akika puku iri asato ndị ọzọ bi.

1

Igwe akịka na-ebi n'ụlọ e ji ájá ala rụọ. Ụlo akika a nwere ike ịdị n'okpuru ala, ma ọ bụ n'elu ala, ma ọ bụ ha abụọ.

Nkebi nke anyị nwere ike ịhụ n'elu ala bụ ụlọ akịka nke e ji ájá chịkọọ. Ọtụtụ ụlọ akịka dị ihe dịka mita abụọ ruo mita ise n'elu ala.

2

Akịka ọbụla na-arụ ọrụ dịgasị iche iche maka ọdịmma ìgwè ha dum. Naeku na Naserian bụ ndị ọrụ. Ndị ọrụ niile bụ ụmụ nwaanyị. "Anyị bụ ndị na-arụ ụlọ na ndị injinia!" ka Naeku kwuru.

Akịka ndi ọrụ na-arụlite ma na-elekọta ụlọ akịka ha. Naserian kwuru, sị, "Anyị na-arụ nnukwu ụlọ ndị na-agbagwoju anya."

3

Naeku tụrụ aro, sị, "Ka anyị kọwaa otú anyị si arụ ụlọ anyị. Anyị na-amalite site n'igwu olulu n'ime ala."

Naserian kwụrụ si, "Anyị na-eji agba anyị dị ike gwuo ala. Anyị nwere ike ibugharị ọtụtụ ala!"

4

Naserian kwuru, sị, "Iji n'aka na mgbidi nke ọwara anyị siri ike, anyị na-eji asọ mmiri na ájá e gwakọtara agwakọta na-ekpuchi ha."

Naeku gbakwụnyere si, "Mgbe asọ mmiri na ájá ahụ a gwokọtara onu kpọnwụrụ, ọ na-esi ike dị ka aja ụrọ. Akwụ́ akịka nwere ike ịdịru ogologo oge."

5

Naserian kwuru si, "Anyị na-ekpopụta ájá anyị gwuru ma jiri ya rụọ ụlọ n'elu ala. Ụlọ ahụ na-adịkarị okirikiri ma ọ bụ dị ka okoso, nwee ọtụtụ ọwara."


"Ụfọdụ ụlọ akịka na-adị elu dịka mita itoolu!" ka Naeku kwuru.

6

Akịka bụ ụmụ ahụhụ na-akpakọrịta, na-ebi na nnukwu ìgwè. Ha nwere ọrụ dị iche iche ha na-arụ n'ịmebe na ịdozi ezinụlọ ha.

Akịka ndị ọrụ dị ka Naserian na Naeku n'egwu ma ruo ụlọ ha. Akịka ndị agha na-echekwa ụlọ ha. Ma ndị ọrụ ma ndị agha na-apụ ịga chọta ebe ọhụrụ ha ga-arụ ụlọ akika ha.

7

Ndị akịka nọọsụ na-elekọta lolo na ụmụ akịka amụrụ ọhụrụ anya.

Ulọ ha nwere ebe dị iche iche. Enwere ọnụ ụlọ maka lolo, ọnụ ụlọ maka ụmụ akịka ọhụrụ, na ọnụ ụlọ ebe ana echekwa nri. Ọwara na-ejikọ ebe niile a dị iche iche.

Lolo akịka bụ akịka kachasị ibu, ọ bụkwa ya kachasị adịte ogologo ndụ.

8

Naserian gara n'ihu kwuo, sị, "Anyị na-arụ owara ma ọ bụ oghere n'elu maka ikuku oma ibata n'ụlọ akịka ahụ."

Naeku agbakwunye si, "Ikuku ọma dị mkpa maka akịka iji dị ndụ."

Naserian kọwara sị, "Ohere ndị ahụ na-enyekwa aka ịchịkwa okpomọkụ dị n'ụlọ akịka ka ọ ghara ikpo oke ọkụ."

9

"Anyị nwere ubi n'ụlọ akịka anyị, bụ́ ebe anyị na-akụ ero. Anyị na-achịkọta ụmụ irighiri ihe ndị sitere n'osisi na ihe ndị ọzọ sitere n'okike, ihe ndịa ka anyị na-eji azụlite ero," ka Naserian kwuru.

"Yum!" ka Naeku tiri n'mkpu. "Ubi ero ahụ na-enye ezinụlọ anyị niile nri. Anyị bụ nanị ụdị akika nke na-akụ ero."

10

Ezinụlọ akika nwere eze na lolo. Ndị ọrụ na-enye ndị a dị mkpa nri ma na-echekwa onye ọbụla nọ n'ezinụlọ ahụ.

Lolo akika na-ebikarị ihe dị ka afọ iri abụọ ruo afọ iri atọ. Ọ nwere ike iyi ọtụtụ àkwá n'oge ndụ ya. Nwa ọhụrụ ya na-esi na àkwá aputa ma ndị akika nọọsụ na-elekọta ha anya.

11

Naserian kwuru, sị, "Ọha Akịka na-adi nhaziri nke ọma. Akịka ọ bụla na-enye aka n'ịdi ndu na nganihu nke ezinụlọ ha niile."

Naeku agbakwụnye, sị, "Onye ọ bụla n'ime anyị nwere ọrụ ọ na-arụ, anyị na-arụkwa ya. Ndị akịka na-emekọ ihe ọnụ nke ọma."

"Ee," ka Naserian kwetara. "Ugbu a, ka anyị laghachi n'igwu ala!"

12
You are free to download, copy, translate or adapt this story and use the illustrations as long as you attribute in the following way:
Anyị Bi N'ụlọ Akika
Author - Nina Orange, Ursula Nafula
Translation - Ibekeme Merit
Illustration - Kenneth Boyowa Okitikpi
Language - Igbo
Level - Read aloud