E nwere otu nwa agbọghọ bi n'obodo Pitiko. Aha ya bụ Inna. A ma Inna ama maka nkà ya n'agha.
Eze maara maka nkà Inna nwere. Ọ na-akpọ ya mgbe ọ bụla e nwere agha.
Inna bụ nwa agbọghọ nwere obi ike nke na-edu ọtụtụ puku ụmụ̀ nwoke n'agha. Otu ụbọchị, Inna mere njem.
A wakporo ndị obodo Pitiko mgbe ha na-ehi ụra. A kwaturu ụlọ obibi ha. Ọtụtụ ụmụ nwoke gbaara ọtọ gbapụ. Ndị mwakpo ahụ dọọrọ ọtụtụ ụmụ nwaanyị na ụmụaka n'agha dika ohu.
Mgbe Inna lọtara, o bere ákwá mgbe ọ hụrụ ka a gbara obodo ya ọkụ. ụmụ nwoke niile ahụ agbaala ọsọ ma zoo n'oké ọhịa dị n'ofe osimiri ahụ. Inna gbagara n'ọhịa ahụ wee zute ha.
Inna kpọkọtara ndị agha nile nọ n' obodo ha. O duru ha ịchụ ndị mwakpo ahụ iji tọhapụ ndị ya e ji eji.
Obi tọrọ Eze ha ụtọ nke ukwuu mgbe Inna kpọlatara ndị nile a dọọrọ n'agha ná ndụ.
Ka ọtụtụ afọ gasịrị, Eze ahụ nwụrụ. Ndị niile nọ n'obodo Pitiko gbakọtara. Ha chiri Inna eze ha. Ụmụ nwoke niile na-asọpụrụ ya.