Ụwa anyị
Herminder Ohri
Herminder Ohri

Chineke chọrọ onye ga na-elekọta ụwa.

1

Ọdụm wepụtara onwe ya, "Abụ m eze, enwere m ike ime nke ahụ."

2

Enyí tiri mkpu, "Abụ m nnukwu anụmanụ. Adị m mma maka ọrụ a."

3

Agu mmiri chere na ezé ya dị nkọ mere ka ọ bụrụ onye ziri ezi maka oru a.

4

Ugo chịrị ọchị si, "Ana m efe efe na-ahụ ihe niile. Adị m mma maka ọrụ a."

5

Chineke kwuru sị, "M ga-eke mmadụ maka ọrụ a."

6

Chineke kere ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị nwere akpụkpọ ahụ́ ojii.

7

Ndị ọzọ nwere akpụkpọ ahụ́ aja aja.

8

Ndị ọzọ nwere akpụkpọ ahụ́ edo edo.

9

Ndị ọzọ nwere akpụkpọ ahụ́ na-acha ire ire

10

Agu mmiri chịrị ụmụ mmadụ ọchị, sị, "Kedu ka ha ga-esi gwuo mmiri?"

11

Chineke mụmụrụ ọnụ ọchị si, "Ha ga-amụta ya."

12
You are free to download, copy, translate or adapt this story and use the illustrations as long as you attribute in the following way:
Ụwa anyị
Author - Herminder Ohri
Translation - Ibekeme Merit
Illustration - Herminder Ohri
Language - Igbo
Level - First words