Nnụnụ Pam-Pam
Traditional San story
Manyeka Arts Trust

Pensa bụ dinta kacha mma na ọzara Kalahari niile. Ọ wetara anụmanụ ndị mara abụba ma nye ezinụlọ ya nri nke ọma.

Enwere nnụnụ a, nnụnụ a na-akpọ Pam-Pam, nke Pensa chọrọ ijide. Nku ọdụ nnụnụ ahụ zuru oke maka akụ ya oji agba ụta. Nsogbu ya bụ na ọ dịghị mgbe ọ pụrụ ijide ma ọ bụ gbagbuo Pam-Pam.

Akụ Pensa gaara-efefe n'ikuku dị ka nnụnụ - ma ọ bụrụ na ọ nwere ike ijide Pam-Pam ma wepụ nku ọdụ ya!

1

Pensa gakwuru nwoke nwere amamihe, onye na-agwọ ha n'obodo ha. Ọ rịọrọ ya maka enyemaka. "Biko duzierem ka m ga-esi jide nnụnụ Pam-Pam. Achọrọ m nku ya maka ụta na akụ m. Gịnị ka m ga-eme iji jide ya?"

Onye ahụ na-agwọ ọrịa zara, sị, "Gaa mee ọkụ. Mgbe ụmụ ahụhụ nile si n'ọkụ gị gbapụ,ị ga-ejidekwa nke kasị nta n'ime ha. Mee ọnyà ma tinye obere ahụhụ a n'ime ọnyà gị. Ọ ga-adọta nnụnụ Pam-Pam."

2

Pensa amaghị na onye ọgwọ ọrịa obodo ha ahụ na nnụnụ Pam-Pam bụ enyi. Pam-Pam na-agakarị na nke onye ọgwọ ọrịa ahụ. Ha abụọ na akọọrọ ibe ha akụkọ.

"Ana m adọ gị aka ná ntị," ka onye ọgwọ ọrịa ahụ kwuru mgbe nnụnụ Pam-Pam letara ya. "Agwara m onye dinta otú ọ ga-esi jide gị. Mgbe ị hụ ọkụ n'ọhịa, ị ga-efega n'ebe dị anya. Achọrọ m ịhụ onye n'ime unu ga-emeri."

3

Ka ọ dị ugbu a, Pensa malitere ichu nta ya maka nnụnụ Pam-Pam. Ọ nọdụrụ ala n'ọhịa ma na-ete osisi ya ọkụ.

Mgbe anwụrụ ọkụ pụtara, ọ fụchara ezigbo ahịhịa ndị dị gburugburu nkụ ya, ruo mgbe obere ire ọkụ pụtara wee ghọọ ọkụ.

Ụmụ ahụhụ ndị nọ gburugburu ahịhịa ahụ na-ere ọkụ fepụrụ, ma Pensa jisiri ike jide otu nwa ukpana. O tinyere ya n'ọnyà ya.

4

Nnụnụ Pam-Pam ahụ enweghị ike iguzogide nwa ukpana ahụ na-atọ ụtọ nke nọ n'ọnyà Pensa. O kpebiri iji ọnụ ya dị nkọ rịdata ma were ya ngwa ngwa. Pensa nụrụ ka nnụnụ Pam-Pam na-eti mkpu, "Pam-pam, pam-pam, pam-pam."

Pensa gbagara n'ọnyà ya. Nnụnụ ahụ tọrọ atọ n'ọnyà ya!

5

Nnụnụ Pam-Pam rịọrọ Pensa ka ọ tọhapụ ya.

"Ehee ee e," Pensa kwuru, "Achọrọ m ijide gị ogologo oge. Taa ị bụ nke m! Nku gị ga-eme ka akụ m fegharịa n'ikuku, dịka gị."

6

Nnụnụ Pam-Pam tiri mkpu, sị, "Ọ bụrụ na i gbuo m, ị gaghịzi enwe nku ọzọ maka akụ́ gị mgbe nku ndị a kaa nká, n'ihi na m ga-anwụ.

Hapụ m ka m nwere onwe m, m na-ekwe gị nkwa inye gị nku ọhụrụ n'ọnwa ọ bụla ọnwa gbazuru."

7

Pensa hapụrụ Pam-Pam ka ọ laa.

MGBE Pam-Pam na-apụ, o chere, sị, "Àbụ m onye nweere onwe m n'ezie?"

8

Pensa lara n'ụlọ ya wee mepụta akụ́ ọhụrụ.

Mgbe ndị mmadụ hụrụ akụ́ ọhụrụ ya, ha tiri mkpu, sị, "O-o Lee onye dinta a! Ọ na-ebu nku nnụnụ Pam-Pam na akụ ya. Ugbu a, ọ ga-achụ nta nke ọma ma wetara anyị ezigbo nri. Anyị ga-enwe oriri!"

9

N'abalị ahụ, onye ọgwọ ọrịa ahụ duru ndị mmadụ na-agba egwu ọkụ iji mee emume maka ọganihu dinta ahụ na nwere onwe nnụnụ Pam-Pam nwere .

Site n' ụbọchị ahụ gaba n'ihu, ezigbo ndị dinta niile na-echeta ikọọrọ ụmụ ha akụkọ gbasara nnụnụ Pam-Pam, dị ka ihe ncheta nke ụbọchị ndị gara aga.

10

Ihe ndị e dere n'akụkọ a bụ n'afọ 1998! Onye na-akọ akụkọ Xun Pensa Limungu (1949 ⁇ 2007) gụrụ akụkọ a n'egwu, nke Khonga ọdịnala na-eso, nye Marlene Winberg onye sụgharịrị ya site n'enyemaka nke Kapilolo Mahongo. Ọ na-ekwu banyere mmekọrịta dị n'etiti okike na ndị mmadụ, onye dinta na onye a na-achụ nta. Ọ na-akụziri ndị na-ege ntị otú onye dinta si adabere n'ihe ndị sitere n'okike ma ghara imefusị ha. Ihe osise dị n'akụkọ a sitere na akụkọ bod site n'aka Marlene Winberg, Satsiri Winberg sụgharịrị ya site na nhazi nke Manyeka Art Collection nke ihe ndi eserese ndi osise San mere.

11
You are free to download, copy, translate or adapt this story and use the illustrations as long as you attribute in the following way:
Nnụnụ Pam-Pam
Author - Traditional San story
Translation - Ibekeme Merit
Illustration - Manyeka Arts Trust
Language - Igbo
Level - Read aloud