Anwụnta na-akpasu iwe
Ursula Nafula
Magriet Brink

Kpọọ! Kpọọ!

1

"Ònye nọ ebe ahụ?" Ka m jụrụ n'anya ụra

2

"Ọ bụ m," ka olu dara ụda zara.

3

"Ònye bụ 'm'?" Ka m jụrụ.

4

"Agwara m gị, ọ bụ n-a-a-n- i m," otu olu ahụ kwuru.

5

"Amaghị m onye ọ bụla a na-akpọ, 'n-a-a-n-i m,'" ka m zara.

Enyochara m ihu na ugbu anwụnta m kpuchiri akụkụ àkwàndinà m

6

"Ee, aha m bụ Amọs."

Olu ya na-ada ụda karịa ka ọ dị na mbụ. Ọ na adasi ike na ntị m.

7

"Onye bu Amos?" Ka m ajụrụ ma na-ele anya n'okpuru akwa mgbochi anwụnta.

8

"Amos Quito," olu ahụ kwuru n'ikpeazụ.

Ọ bịa taa m na ntị m.

9

"Aah!" M wụlie elu ma malite ịchọ ya.

"Ị ga-akwụ ụgwọ ihe a I mere!" Kam tiri na mkpu.

10

N'iwe, m si n'àkwà bilie gbanye ọkụ.

11

M kpọsa agha megide Amos Quito na-akpasu iwe!

12
You are free to download, copy, translate or adapt this story and use the illustrations as long as you attribute in the following way:
Anwụnta na-akpasu iwe
Author - Ursula Nafula
Translation - Ibekeme Merit
Illustration - Magriet Brink
Language - Igbo
Level - First sentences