Akụkọ egwurugwu
Mimi Werna
Edwin Irabor

Udoo, Erdoo na Eryum gbakọtara n'ebe nne nọ. N'oke ihunanya nọ ya n'obi na akara na-anọchi anya ezinụlọ o ji n'aka ya. Nne kpochara akpịrị ya wee malite akụkọ:

E nwere otu nwatakịrị nwaanyị aha ya bụ Yana. Nwanne nne Yana gwara ya banyere ite ọlaedo dị ná ngwụsị nke egwurugwu. Yana chọrọ ịmata ihe banyere ite ahụ.

Ihe dị n'ime ite ahụ ọ̀ bụ mkpụrụ ego ọlaedo, ka ọ bụ ùkwù ọlaedo ndị dị n'ime nkume ojii?

1

Yana chere na ọ bụrụ na ya elee anya n'eluigwe ruo ogologo oge, na ya ga-enweta azịza ụfọdụ.

Ọ mụmụrụ ụmụ nnụnụ ọnụ ọchị. Ọ nọ na-eche otú ọlaedo ahụ si banye n'ime ite ahụ.

Ma, ebee ka ọ ga-ahụ ite ahụ n'isi ngwụcha egwurugwu? Ọ gaara amasị Yana ma a sị na ọ maara kpọmkwem ebe ahụ!

2

Ka ọ na-eche banyere ọchichọ egwurugwu ọ na-achọ, ọ hụrụ otu awọ na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ ka ọ na-awụli elu n'ime ohia. O nwekwaghị ike iguzogide ya, o sooro awọ ahu na-awụli elu ruo nwa oge.

Mgbe ahụ, ka ọ na-elepụ anya n'eluigwe, ọ sịrị awọ ahụ gaa nke ọma. Yana gara n'ihu ichọ njedebe egwurugwu.

3

Ọ malitere iche banyere agwa egwurugwu di iche iche. N'otu ntabi anya, agwa mbụ batara ya n'uche bụ ọbara ọbara.

O chetara otu ụbọchị ọ fọrọ obere ka ya na ndị ezinụlọ ya nwee ezigbo ihe mberede n'ihi na onye na-anya ụgbọala ha akwụsịghị n'ebe ahụ ọkụ na-acha ọbara ọbara.

Yana nwere obi ụtọ na ọ dịghị onye merụrụ ahụ nke ukwuu, ọ bụ ezie na ha nile nwere ọnyá na ọnyá nta. Egwu jidere onye ọ bụla.

4

Mgbe ọ chechara maka agwa na-acha ọbara ọbara, Yana chere maka agwa na-acha oroma. O nwere mmasị n'oroma na-atọ ụtọ.

Ụtọ, utoojoo na ilu bụ ụtọ ndi ọ nwetara mgbe ọ na-aracha oroma.

Iche maka oroma na-agbaka nti mere ka ọnụ Yana na-ato ngbaka-ngbaka! Tufiakwa! Ị̀ maara ụtọ ahụ?

5

Echiche Yana si na oroma gaa n'igbe nwere àgwà indigo ojii, afọ ya na-eme mkpọtụ. Ọ chọpụtara na agụụ na-agụ ya.

Ọchịchọ ọ na-achọ egwurugwu ga-echere nwa oge. Oge eruola iri nri!

6

Ọ gbabara n'usekwu nwanne nne ya. Ebe niile juputara n'isi ọkụkọ e ghere eghe na achịcha ọhụrụ.

Yana sachara aka ya, imi ya edugakwa ya n'ebe ísì nri ahụ dị. O riri obere ọkụkọ na nnukwu achịcha, ma ṅụọ mmiri.

O lere uwe ya anya. Haa! Kedu udi unyi bu nke a! Unyi sitere na ọkụkọ, na mmiri wụru n'uwe ya. N'ihi ya, o yiiri uwe na-acha odo odo mara mma.

7

Ka e mesịrị, Yana na nwanne nne ya sooro gaa n'ogige ntụrụndụ.

Ha dina n'ahịhịa na-agụ akwụkwọ. Yana ji ịnụ ọkụ n'obi na-enyocha peeji ndị di n'akwụkwọ ahụ, na-achọsi ike ịmatakwu banyere ite ọlaedo ahụ e zoro ezo.

Nwanne nne Yana mụmụrụ ọnụ ọchị n'ihi otú obi si dị ya ụtọ, ha abụọ wee malite ịchị ọchị. Ha malitere ịgụkọ akụkọ ahụ ọnụ.

8

Ọ bụ akụkọ banyere etu agwa egwurugwu si bịa n'ala Tonota, na nwatakịrị nwoke a na-akpọ Mpho.

Ruo ogologo oge, ndị Tonota maara nanị akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ nke osisi na aja aja nke ala. Mana Mpho rọrọ nrọ nke urukpu n'agwa ndị dị ebube!

Ọ kọọrọ ndị okenye nrọ ndị ahụ ọ rọrọ. Ha sịrị, "Ọ bụrụ na ị kpọọ aha agwa ahụ, anyị ga-eme ka ha dị ndụ."

9

Ndị okenye ahụ rịọrọ maka enyemaka nke ndị na-eme ka mmiri zoo site n'akụkụ nile nke mba ahụ, ha zukọtakwara.

Mpho malitere iche maka agwa dị na nrọ ya. Mgbe ahụ, okwu ndị a batara ya n'uche, "Obara-obara, anụnụ anụnụ, oroma, edo edo, odo odo, ndu ndu, na indigo."

Urukpu mara mma jupụtara na mbara igwe!

10

Urukpu gbachiri n'ikuku, ndị ahụ na-eme mmiri ozuzo wee gbaa gburugburu, jidekwa onwe ha aka. Ha lere anya n'urukpu na agwa ndị ahụ kpụrụ ọmarịcha oghere.

Nke a bụ egwurugwu mbụ nke Tonata! Ndị mmadụ tiri mkpu ọṅụ.

Ozugbo ahụ, Mpho hụrụ ite dị na njedebe egwurugwu ahụ. Ọ bụ ite juputara na ọla-edo!

11

"Akụkọ egwurugwu a dị ịtụnanya! Ugbu a amatala m ebe m ga-achọta ite ọla edo m!" Yana kwara nwanne nne ya.

Nwanne nne ya mụmụrụ ọnụ ọchị, obi dị ya ụtọ na ọ kọọrọ nwa nwanne ya akụkọ kachasị amasị ya mgbe ọ bụ nwata. "Ma, ị gaghịzi achọ egwurugwu ọzọ. Ọ bụ nanị na mberede ka a pụrụ ịchọta ite ọlaedo ahụ!"

12

Nne ha ji okwu ndị ahụ mechie akụkọ banyere egwurugwu ọ kọrọ ha. Udoo, Erdoo na Eryum wụliri elu ma kụọrọ ya aka.

Mgbe ahụ, ha jidere onwe ha aka dị ka ndị na-emepụta mmiri ozuzo, na-eme ka a ga-asị na ha na-emepụta egwurugwu ha!

13

"Nne, ala ọ bụla ò nwere akụkọ egwurugwu nke ya?" ka Erdoo ji nwayọọ jụọ.

Nne ha zara, "Ee, umu ọma m." "Egwurugwu Tonota malitere site na nrọ Mpho banyere urukpu nwere agwa di iche iche. Ma chetakwa akụkọ Osimiri Egwurugwu di Anwansi na ihe nracha egwurugwu ya?"

"Mmmm, ihe nracha egwurugwu, nke ahụ bụ akụkọ kachasị amasị m," ka Eryum kwuru na-ele nne ya anya ka ụmụaka gbakọtara ya gburugburu ọzọ.

14
You are free to download, copy, translate or adapt this story and use the illustrations as long as you attribute in the following way:
Akụkọ egwurugwu
Author - Mimi Werna
Translation - Ibekeme Merit
Illustration - Edwin Irabor, Jesse Breytenbach, Offei Tettey Eugene
Language - Igbo
Level - Read aloud