

Otu nwaanyị na nwa ya gara n'ime ọhịa.
Ọ gara ịtụtụ mkpụrụ osisi.
N'ime ọhịa ahụ, ọ hụrụ otu osisi nwere mkpụrụ osisi chara acha.
O dobere nwa ya na-ehi ụra wee rịgoro n'elu osisi ahụ.
Otu erotot sitere na obodo ọzọ bịara. Ọ hụrụ nwa ọhụrụ ahụ. O juru ya anya.
Ọ jụrụ onwe ya, "Olee ebe nne ya nọ?"
O hulatara ala.
Ụda ola olu ígwè no ya n'olu kpọtere nwa ọhụrụ ahụ n'ụra.
O kwere ka nwa ọhụrụ ahu jiri ola olu ígwè ya gwuo egwu.
Nwata ahụ chịrị ọchị ka ọ na-egwuri egwu.
Nwanyị ahụ ledara anya ka ọ hụ ihe mere nwa ahụ ji na-achị ọchị.
Ọ hụrụ onye ala ọzọ ahụ.
Ụjọ tụrụ ya nke ukwuu nke na ọ tụpụrụ akpa mkpụrụ osisi ya.
Onye ala ọzọ ahụ lere anya.
Ọ sịrị, "Atụla egwu, naanị nwa gị mara mma ka mu na ya na-egwu egwu."
Nwaanyị ahụ wee si n'osisi ahụ rịdata.
Onye ala ọzọ ahụ wepụrụ otu n'ime ola olu ígwè ya.
O nyere ya nwa ọhụrụ ahụ. "Nke a bụ onyinye m na-enye gị.
"Kpọrọ nwa gị laa. Gwa di gị ka ọ kwaga n'obodo ka nwee udo karịa. Nwa gị enyela m udo," onye ala ọzọ ahụ kwuru.

