

N'otu oge, Agụ iyi nọ ọdụ n'akụkụ nnukwu ọdọ mmiri na-agba anyanwụ.
Enwe rutere na mmiri ahụ, ha abuo kelee onwe ha.
Enwe jụrụ ebe Agụ iyi bi. Agụ iyi zara, "Ebi m n'ime ọdọ mmiri."
Ọ tụrụ enwe n'anya. Ọ jụrụ Agụ iyi, "Olee otú ndụ dị na mmiri? Ọ dị mma?"
Agụ iyi zara si, "Ndụ n'ime mmiri dị mma, ebee ka i bi?"
Enwe zara, "Ebi m n'osisi, ana m eri mkpụrụ osisi na akwụkwọ osisi. Gịnị ka ị na-eri?"
Agụ iyi zara, "Ana m eri anụ."
Ọ na-eche ka ọ ga-esi jide Enwe ma rie ya.
Ọ jụrụ Enwe, "Ịma egwu mmiri?"
Enwe zara, "Mba! Amaghi m egwu mmiri."
Agụ iyi si, Ka m kuziere gị ka esi egwu egwu.
Enwe zara sị, "Mba, enweghị m mmasị."
Agụ iyi tụrụ Enwe asị, sị, "Anyị aghọla enyi, atụla m egwu, bịa nọdụ n'azụ m."
Ya mere Enwe wee nọdụ ala n'azụ Agụ iyi. Agụ iyi wee malite igwu mmiri.
Mgbe ha rutere n'etiti ọdọ mmiri ahụ, Agụ iyi jụrụ Enwe, "Kedu ka ọ dị gị ka ịnọ na ọdọ mmiri a? I nokwa mma?"
Enwe zara, "Ọ bụ ihe na-adọrọ mmasị, tinyere n' obi dịkwa m ụtọ."
Agụ iyi turu ude wee sị Enwe, "Nwanne nna m na-arịa ọrịa nke ukwuu, anyị ahụbeghị ọgwụ a ga-eji gwọọ ya."
Enwe tụrụ oke egwu nke na ọ na-ama jijiji.
Ọ nọ na-eche otú ọ ga-esi gbanarị Agụ iyi.
Mgbe ahụ, otu echiche gbatara Enwe n'uche.
O wee sị Agụ iyi, "Echegbula onwe gi, m ga-enye obi m maka nwanne nna gị, anụ enwe ga-agwọ ya."
Nke a masịrị Aguiyi. Ọ sị, "N'ezie! Ị ga-adị njikere inye obi gị maka nwanne nna m?"
Enwe zara, "Ee n'ezie. Anyị bụ enyi!"
Ka obere oge gara, Enwe sịrị, "Ewoh! Ọ dị m nwute n'ezie enyi m. Echefuru m obi m n'osisi, ka anyị laghachi azụ ka m weta ya."
Agụ iyi gburu oge wee jụọ, "Ị ji n'aka? Ị ga-eweta obi gi nọ n'elu osisi ahụ?"
Enwe zara, "Ee, a ga m eweta ya, a ga m esokwa gị gaa leta nwanne nna gị."
Agụ iyi kwetara wee gwuo mmiri laghachi n'akụkụ ọdọ mmiri ahụ.
Ozugbo ha rutere n'ala, Enwe si n'azụ Agụ iyi wụpụ.
Site na nchekwa nke alaka osisi, Enwe kpọkuru ya si, "Gaa nke ọma enyi m, agu iyi. Daalụ maka njem nlegharị anya ọdọ mmiri."
Agụ iyi were iwe. Ọ mara ọsọ, "Ị ghaara m ụgha? I ji obi gị aloghachite azu?"
Enwe zara, "Anọdụ nwuru m n'azụ gị n'ihi na mu na obi m nọ!"

