Akatope
Alice Kariuki
Catherine Groenewald

N'otu oge, e nwere otu nwanyị bi nu.

Ọ chọọla nwa nke ukwu

1

Nwanyị ahụ weere ala ụrọ kacha mma ọ hụrụ.

Ọ malitere ikpụ Nwatakịrị nwanyi.

2

Nwatakịrị nwanyị ahụ e ji ájá kpụọ ghọrọ ezigbo nwata nwanyi.

Nwanyị ahụ kpọrọ Nwatakịrị nwanyị ahụ Akatope.

3

Obi tọrọ nwaanyị ahụ ụtọ nke ukwuu.

Ọ hụrụ Akatope n'anya nke ukwuu.

4

Nne akatope dọrọ ya aka na ntị ka ọ ghara ịpụ n'ụlọ a.

Ọ egeghị ntị. Mgbe ọ bụla nne ya na-anọghị n'ụlọ, Akatope gbapụrụ ka ya na ụmụaka ndị ọzọ gwurie egwu.

5

Otu ụbọchị, Akatope so ụmụaka ndị ọzọ na-egwu egwu.

Mmiri malitere izosi ike.

6

Ụmụaka ndị ọzọ gbagara n'ụlọ ha.


Ka Akatope na-agba ọsọ, ụkwụ ya malitere ịgbaze. Ọ gbadara n'ala wee nọdụ ala n'etiti ọhịa.

7

Ụmụaka ndị ọzọ gwara nne na nna ha ihe mere Akatope.

O wutere ha nke ukwuu, wụkwa ha akpata oyi n'ahụ́.

8

Mgbe nwanyị ahụ nụrụ ihe mere Akatope, o bere ákwá ọtụtụ ụbọchị.

Ndị obodo ahụ kpọọrọ nwata na-enweghị nne na nna kpogaara nwanyi a ka ọ nochie ọnọdụ Akatope.

9

Ma nke ahụ adịghị mkpa.

Nnukwu ihe ijuanya chere nwanyị ahụ!

10

Otu abalị, akuru aka nwayọọ nwayọọ n'ọnụ ụzọ.

11

"Ònye ka o nwere ike ịbụ," nwanyị ahụ tụlere.

12

Akatope alọtala n'ụlọ.

Ike gwụrụ ya, ahụ́ adịghịkwa ya.

13

Nne Akatope rere ihe niile o nwere. O ji ego ahụ gwọọ Akatope.

Akatope tolitere wee bụrụ nwa agbọghọ kacha maa mma n'ime obodo ha.

14
You are free to download, copy, translate or adapt this story and use the illustrations as long as you attribute in the following way:
Akatope
Author - Alice Kariuki
Translation - Ibekeme Merit
Illustration - Catherine Groenewald, Wiehan de Jager
Language - Igbo
Level - First paragraphs