Mmadu na Ọdụm
Mozambican folktale
Hélder de Paz Alexandre

Otu oge gara aga, nwoke na-eje ije n'ime ohia.

Na mberede, ọ zutere ọdụm!

1

Ọdụm nọ na-ezu ike n'ime obere ahịhịa

2

Nzute ahụ ọ zụtere ọdụm bịara na mberede nke na mmadụ amaghị ihe ọ ga-eme.

Ụjọ juputere ya ahu.

3

Na mbụ, o juru Ọdụm anya, ụjọ tụkwara ya.

Ma enwere obere mkpọtụ n'afọ ya, n'ihi na agụụ na-agụ ya.

4

Nwoke ahụ hụrụ onwe ya na mberede n'elu osisi dị elu.

Ọ malitere iti mkpu na ebe ọdụm nọ.

5

Ọdụm dinara n'okpuru osisi ahụ, na-eche nri ya.

Ka oge na-aga, ọdụm dara n'ụra, ma ọ bụ otú ahụ ka ọ dị.

6

N'oge na-adịghị anya, ụra buuru nwoke ahụ. Ọ tetara ọzọ.

N'ikpeazụ, ụra buuru ya ọ wee rahụ ụra nke ukwuu.

7

Ma mgbe ahụ, ọ dakwasịrị ọdụm ahụ na-ehi ụra!

8

Ha abụọ tetara na mgbagwoju anya na ụjọ.

Ọdụm chefuru nri ya wee gbaa ọsọ maka ndụ ya.

9

Mmadụ malitere ịgba ọsọ n'otu ụzọ ahu ọdụm n'agba.

Oge ahụ, ọ chọpụtara na ọ na-agba ọsọ n'azụ ọdụm!

10

Ya mere ọ gbanwere ụzọ ya wee gbapụ.

Ọdụm erighi ya!

11
You are free to download, copy, translate or adapt this story and use the illustrations as long as you attribute in the following way:
Mmadu na Ọdụm
Author - Mozambican folktale
Translation - Ibekeme Merit
Illustration - Hélder de Paz Alexandre
Language - Igbo
Level - First sentences