

Amara dị afọ itoolu. Ọ gara ụlọ akwụkwọ praịmarị na Ụlọ akwụkwọ praịmarị nke Kerema. Sobjekiti ndi kacha amasị ya bụ asụsụ bekee, Sayensị na Ihe ọmụmụ gbasara mmekọrịta mmadụ na ibe ya.
Ọ chọrọ ịbụ ọkàiwu mgbe o tolitere. Amara hụrụ anụmanụ n'anya nke ukwuu..
Amara na nne ya Margy, biri. Ọ bụ onye ọrụ ugbo na-arụsi ọrụ ike.
Nna Amara nwụrụ mgbe ọ dị afọ ise.
Mgbe Amara na-anọghị n'ụlọ akwụkwọ, ya na ewu anakpọ Mbisa na-anọ.
Ọ hichara ma nye ya nri.
Amara nwekwara anụ ụlọ ya, aha ya bụ Simba. Nne ya ahụghị nkịta n'anya nke ukwuu, mana o kwere ka Amara debe Simba.
Mgbe ọ bụla Simba kpasuru ya iwe, ọ na-eti mkpu, "Pụọ ebe a tupu m were ukwu gbapụ gị." Amara nwere mwute.
Otu ụbọchị Satọde, ha nwere ndị ọbịa si otu ụmụ nwanyị.
Amara nwere obi ụtọ na ndị enyi nne ya na ụmụ ha bịara. Ha nwere ike ịgba bọọlụ.
Nne ya esiela nri na-amasị ndị otu ahụ.
Nne Amara chetaara ya ka ọ kpọchie Simba. Ọ na-agbo ndị bịara abịa uja.
Amara akpọchighị Simba nke ọma. O juru ndị ọbịa ahụ anya ịhụ nkịta n'ime ụlọ.
Mama Oto jụrụ, Gịnị kpatara i ji ekwe ka nkịta bata n'ime ụlọ?
Nne Amara kpọrọ Amara ka ọ bia kpọpụ Simba.
Amara anụghị ka nne ya na-akpọ ya maka na ha na-egwu egwu.
Mgbe Amara bara n'ụlọ, ọ kpọpụtara Simba. Simba na-erubere Amara isi nke ukwuu.
Mgbe ha richara nri, ndị ọbịa ahụ kwuru, 'Anyị ga-emeso nkịta anyị nke ọma dị ka Amara. Anyị na-emegbu ha, ma ha na-enyere anyị aka.
Mgbe nke ahụ gasịrị, nne Amara rịọrọ mgbaghara maka imerụ obi na ajọ omume ọ mesoro Simba.
Mgbe Amara nọ n'ụlọ akwụkwọ nne ya na-enye Simba nri. Ndị enyi nne ya amụtala imeso nkịta ha omume Mgbe Amara nọ n'ụlọ akwụkwọ nne ya na-enye Simba nri. Ndị enyi nne ya amụtala imeso nkịta ha omume ọma.

