Osisi Udo
Mpumelelo Mlangeni
Mpumelelo Mlangeni

Enwere otu nwata nwanyi aha ya bụ Ayanda.

Ayanda bu so otu nwa nne na nna ya.

Nne na nna ya chọrọ ikewa.

1

Ayanda kpebiri igbapu n'ulo.

Ọ gara n'oke ohia n'ihi na ọ maghi ebe ọzọ ọ nwere ike iga.

2

Agu Owulu no n'ime ohia chụrụ Ayanda ọsọ, ọ wee rigoro n'elu osisi.

Agu owulu ahu chọrọ ita ya, ọ wee rigokwuo elu elu.

3

N'elu ukwu osisi ahu, Ayanda hụrụ ọmalicha anyanwụ.

Onwee ihụnaṅya n'ebe anyanwụ nọ, wee kpebie inọ n'ime ohia.

4

Ayanda na-arigo ụkwụ osisi ahụ ụbọchi ọbụla ka ọ gwa anyanwụ ọkwụ.

Anyanwụ buruzia ezi na ụlọ ya.

5

Otu ubochi, Ayanda hụrụ otu nwoke n'okpuru osisi ahụ.

Nwoke ahụ bụ nna ya.

Ayanda rituru n'ukwu osisi ahụ, nna ya wee kowara ya ihe kpatara ọ ji noro ebe ahụ.

6

Ọ si, "Tupu amụọ gi, mu na nne gi na-ahurita onwe anyi ebea. Ọ bụ ebe pụrụ iche."

Nna Ayanda wee kwuo, "Ọ bụ ukwu osisi a ka m na-arigo iji nweta udo ma mu na nne gi nwee esemokwu."

7

Oge adighi aṅya, nne Ayanda biakwuru n'ime ohia ahụ.

Ọ biara ka ya na nna Ayanda kpee udo.

Nke a bụ osisi udo ha.

8
You are free to download, copy, translate or adapt this story and use the illustrations as long as you attribute in the following way:
Osisi Udo
Author - Mpumelelo Mlangeni, Tshiamo Msimanga, Tumi Mofokane
Translation - Chinwe Oranye, Eberechi Ejuh, Merit Ibekeme
Illustration - Mpumelelo Mlangeni, Tshiamo Msimanga, Tumi Mofokane
Language - Igbo
Level - First paragraphs