

Fati bu nwatakịrị nwanyi na agba ọsọ dị ka ịkụkụ.
O bụ onye ichi ọchi nke oma na-agba wa mbọ ime ihe agwara ya mee.
Otu ubochi, Fati na nna ya ji ịnyịnya igwe ga-ugbo ịrọcha ahịhịa.
Na oge na-adịghị anya, ike gwụrụ Fati, ọ gwa nna ya si, ahụ na-acha m, ike gwuru m. "E.nwere m ike i nọdụ ọdụ na okpuru osịsị mangoro?"
Nna ya zara ya sị, "I n were ike i nodi ala ebe ahụ mana, biko arikwana elu osịsị ọbụla taa."
Fati nọdụrụ ala n' ukwu osịsị mangoro.
Wee leliạ anya n' elu, hụta otu, abụa, atọ mangoro chara acha.
Fati lere anya hu na uche nna ya adighi ya.
Owere nwayọ rigoro ụkwụ osịsị mangoro. Ochere, agama no ebaa zua ike ma takwa mangoro chara acha.
O were nodu ala, taa.
Ka otasiri mangoro, oritua.
Were hu osisi ọzọ nwere ihe na acha aja aja si na ya
asụpụta.
Ọbụ mmanụ anwu, Fati huru mmanu anwu na-anya nke ukwu mana ọhuyi anwu na-anya.
Oleriri anya elu hu otu obere anwu.
Fati chere, na ọ bu nani otu obere anwu, ọgaghị agba mu ma nrigoro ụkwụ osịsị choo mmanụ anwu.
Fati lera nna ya anya hụ na uche ya adịghị ya.
Owere rigoro elu ụkwụ osịsị, tinye aka na olulu were mmanụ anwu.
Fati chere, a ga m a nọ ebaa zụa ike ma racha mmanụ anwu.
O were nodu ala, racha ya.
Ka orachasịrị mmanụ anwu, oritulu n' elu ukwụ osịsị.
Mgbe ahụ ka ọhụrụ igwe anwu BZZZ! BZZZ! BZZZ!
Fati wee rie mbombo ọsọ.
Fati gbakwụrụ nna ya n'eku eluelu na ọnwụ ọnwụ.
Nna ya sịrị ya, "Kedu ebe ịsi wee puta?"
Fati achọghị i gwa ya ebe ọ nọ.
Owe si ya, "Nnam enwerem mangoro."
"I chọrọ ị taa?"
Nna ya sịrị ya, "Mba, daalụ, anyị ga-ala ụgbụa maka na mmiri ozuzo na abịa."
Ka ha na ala na ụlọ, fati no na-azu ịnyịnya igwe nna ya mmịrị were zowe.
Nna ya ji ịnyịnya igwe, gbaa oso dị egwu. ǃnyịnya igwe ya pụrụ na okporo ụzọ, kupiasia!
ǃnyịnya igwe ahụ dakwasịrị fati na ukwu.
Na ụlọ, nne fati na nne ya ochia jụrụ ihe mere na-ugbo ubosi ahủ.
Nna ya gwara ha na Fati rigoro elu ụkwụ osịsị.
Fati gwara ha na nna ya gbasịrịke.
Na ịnyịnya igwe, owe daa ya na ụkwụ.
Nne ya na nne ya ochie wee tie, ewu nwam, ewu nwam.
Anyi ga hụ maka ụkwụ gi, ha mekwara ya.
Onwe gwụ.

