

Udoka bụ nwata mara nma nke ukwuu... Ọ na asọpuru nne na nna ya nke ọma, tinyere ndi okenyea na ndi agbata obi ya. Onye ọbụla hụrụ Udoka na añya nke ọ
ọma.
Otu ụbọchi wee rue, otu nwatakịrị nwoke e were kụọ Udoka ihe na enweghi ihe ọbụla ọ mere nwatakịrị a. Mana o wutere Udoka nke ukwuu na Nne na Nna ya pịara ya ụtalị ma
bara ma ya mba maka na ọ lụrụ ọgụ ma dọkwa ya aka na ntị gbasara ilụ ọgụ.
Ihe Nne na Nna Udoka mere were ya iwe nke ukwuu... Na echiche nke ya, ọ chere na nne ya na nna ga apịa nwatakịrị ahụ ihe ma ọ bụ bara ya mba mana ha emeghi otu ahụ... Nke a mere Udoka jiri gbapụ na ụlọ na enwegi onye mara ebe ọ gbagra..
Nne na nna Udoka malitere ịchọ Udoka ebe di iche iche tinyere ebe ndị enyi ya ma ha ahụghị ya. Mgbe ha n'alagachi n'ụlọ ha na odịda mba ha nụrụ olu na ebe akwa na elu osisi mgbe ha lere anya na elu osisi ahụ, ha hụrụ Udoka ebe ọ n'ebe akwa
Ha rịọrọ ya arịrọ ka ọ rịdata site n'elu osisi ahu mana ọ jụrụ ajụ na nke a. Nne na nna ya gbapụrụ ọsọ ga rịọ enyi ya ka ọ gwa Udoka ka osi n'osisi ahụ rịdata.. Mgbe enyi ya hụrụ ya n'elu ọ rịọrọ ya ka ọ rịdaa Udoka mere nke a n' egbugi oge
Enyi Udoka mere ka ọ mara na ihe nne na nna mere abụghị maka ha ahụghị ya na anya kama ọ bụ ikuziri ya ihe.. Ọ gwakwara ya na omegi nke ọma isi na ụlọ gbapụ na odighi nma nwatakiri ime otu ahụ...
Obi tọrọ Nne na nna Udoka ụtọ mgbe ha hụrụ ya... Ha siri ihe oriri ma mekwa achịcha n'ihi na ọ bụ ụbọchị ncheta ọmụmụ ya... Ha nyere ya ezi ndụmọdụ, Udoka rịọrọ ha mgbahara maka agwa ọjọ ọ kpara... Ọgwụchala...... ka emesịa nụ

